30 Mgbe ahụ, ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ+ ga-apụta n’eluigwe, mgbe ahụkwa, ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị,+ ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.+
7 Ma ọ ga-eme ka unu onwe unu bụ́ ndị a na-akpagbu nwere onwe unu, tinyere anyị onwe anyị, mgbe a ga-ekpughe+ Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike,+