15 N’oge ya a kara aka,+ onye obi ụtọ ahụ na onye naanị ya bụ Eze Ukwu+ ga-egosi onwe ya, onye bụ́ Eze+ nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze, na Onyenwenụ+ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ,
4Ana m enyesi gị iwu ike n’ihu Chineke na Kraịst Jizọs, bụ́ onye a kara aka ikpe+ ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ+ ikpe, site ná mpụta ìhè+ ya nakwa alaeze ya,+
8 Malite ugbu a gaa n’ihu, e debeere m okpueze ezi omume,+ nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume,+ ga-enye m dị ka ụgwọ ọrụ+ n’ụbọchị ahụ,+ ma ọ bụghị naanị m, kamakwa ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.