7 Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya,+ n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ,+ n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ;+ ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+
2 “Ọ bụ aka m mere ihe a niile, nke mere ihe a niile ji dịrị,”+ ka Jehova kwuru. “Ọ bụ onye ihe na-enye nsogbu n’obi, onye nwere mwute na mmụọ ya,+ onye na-amakwa jijiji n’ihi okwu m+ ka m ga-elekwasị anya.
31 Ònye n’ime ha abụọ mere uche nna ya?”+ Ha wee sị: “Onye nke abụọ.” Jizọs wee sị ha: “N’ezie, ana m asị unu na ndị ọnaụtụ na ụmụ nwaanyị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’alaeze Chineke.