64 Jizọs sịrị+ ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.+ Ma ana m asị unu, Site ugbu a+ gaa n’ihu, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+
33 Ya mere, ebe e buliri ya elu ka ọ nọrọ n’aka nri Chineke,+ o wee nata mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa site n’aka Nna ya,+ ọ wụpụwo ihe a nke unu na-ahụ ma na-anụ.
34 Ònye bụ onye ahụ nke ga-ama ha ikpe? Kraịst Jizọs bụ onye ahụ nwụrụ, ee, kama ọ bụ onye e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite, onye nọ n’aka nri+ nke Chineke, onye na-arịọkwara anyị arịrịọ.+
3 Ọ bụ onyinyo nke ebube+ ya. O yikwara ya kpọmkwem.+ Ọ na-ejikwa okwu ya dị ike eme ka ihe niile na-adị;+ mgbe ọ sachapụsịrị mmehie anyị,+ ọ nọdụrụ ala n’aka nri+ nke Onye Ukwu ahụ n’ebe ndị dị elu.+