13 ‘n’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ: Ha ahapụwo mụ onwe m,+ bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,+ ka ha wee gwuoro onwe ha olulu, olulu gbawara agbawa, ndị na-apụghị ichedo mmiri.’
8 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na mmiri na-enye ndụ+ ga-esi na Jeruselem na-asọpụta,+ otu ọkara mmiri ahụ ga na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ otu ọkara ga na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+ Ọ ga-eme n’oge okpomọkụ nakwa n’oge oyi.+
37 Ma n’ụbọchị ikpeazụ, bụ́ oké ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ, o wee tie mkpu, sị: “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ,+ ya bịakwute m ṅụọ mmiri.