2 Ihe E Mere 29:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 O wee sị ha: “Ụmụ Livaị, geenụ m ntị. Doonụ onwe unu nsọ,+ dookwanụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nsọ, wepụkwanụ ihe na-adịghị ọcha n’ebe nsọ.+ Abụ Ákwá 1:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Jeruselem emewo ihe doro anya na ọ bụ mmehie.+ Ọ bụ ya mere o ji ghọọ ihe na-asọ oyi.+Ndị niile na-akwanyere ya ùgwù ejikwaghị ya kpọrọ ihe,+ n’ihi na ha ahụwo ọtọ ya.+Ya onwe ya kwa na-asụ ude,+ chee ihu n’ebe ọzọ. Ezikiel 36:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 “Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel biiri n’ala ha, ha wee jiri ụzọ ha na omume ha na-emetọ ya.+ N’ihu m, ụzọ ha dị ka adịghị ọcha nke oge ịhụ nsọ nwaanyị.+ Ezikiel 36:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 “‘M ga-azọpụta unu n’adịghị ọcha unu niile,+ kpọọ nri òkù, meekwa ka o hie nne. Agaghị m eme ka ụnwụ bịakwasị unu.+
5 O wee sị ha: “Ụmụ Livaị, geenụ m ntị. Doonụ onwe unu nsọ,+ dookwanụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nsọ, wepụkwanụ ihe na-adịghị ọcha n’ebe nsọ.+
8 Jeruselem emewo ihe doro anya na ọ bụ mmehie.+ Ọ bụ ya mere o ji ghọọ ihe na-asọ oyi.+Ndị niile na-akwanyere ya ùgwù ejikwaghị ya kpọrọ ihe,+ n’ihi na ha ahụwo ọtọ ya.+Ya onwe ya kwa na-asụ ude,+ chee ihu n’ebe ọzọ.
17 “Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel biiri n’ala ha, ha wee jiri ụzọ ha na omume ha na-emetọ ya.+ N’ihu m, ụzọ ha dị ka adịghị ọcha nke oge ịhụ nsọ nwaanyị.+
29 “‘M ga-azọpụta unu n’adịghị ọcha unu niile,+ kpọọ nri òkù, meekwa ka o hie nne. Agaghị m eme ka ụnwụ bịakwasị unu.+