6 O wee sị: “Ọ bụghịrị gị obere ihe na ị ga-abụ ohu m iji mee ka ebo niile nke Jekọb bilie nakwa iji kpọghachite ndị Izrel e chebere echebe.+ Enyewokwa m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba niile,+ ka nzọpụta m wee ruo nsọtụ ụwa.”+
15 Okwu a+ kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka a nabata ya n’ụzọ zuru ezu, ya bụ, na Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.+ N’ime ndị a, abụ m onye mbụ.+