18 M ga-esi n’etiti ụmụnne ha họpụtara ha onye amụma nke dị ka gị onwe gị;+ m ga-etinyekwa okwu m n’ọnụ ya,+ ọ ga-agwakwa ha ihe niile m ga-enye ya n’iwu.+
6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+
19 O wee sị ha: “Ihe ndị dị ka gịnị?” Ha wee sị ya: “Ihe mere Jizọs onye Nazaret,+ onye ghọrọ onye amụma+ dị ike n’ọrụ na n’okwu n’ihu Chineke na n’ihu mmadụ niile;
22 N’eziokwu, Mozis sịrị, ‘Jehova bụ́ Chineke ga-esi n’etiti ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka mụ onwe m.+ Geenụ ntị n’ihe niile ọ ga-agwa unu.+