4 N’ihi na a pụghị ime ka ndị e mere ka ha nwee nghọta naanị otu ugboro+ chegharịa ọzọ, bụ́ ndị detụkwara onyinye eluigwe e nyere n’efu ire,+ ndị ghọwokwara ndị so keta mmụọ nsọ,+
19 Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu;+ n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ.+ Ma ha pụrụ ka e wee mee ka ọ pụta ìhè na anyị na mmadụ niile abụghị otu.+