Ezikiel
15 Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, olee otú osisi vaịn+ si dị iche n’osisi ndị ọzọ, ya bụ, alaka nke dị n’etiti osisi ndị ọzọ dị n’oké ọhịa? 3 À na-esi na ya egbute osisi e ji arụ ọrụ? Ka ndị mmadụ hà na-esi na ya egbute mkpọ́ ha na-ekonye ụdị arịa ọ bụla? 4 Lee! A ga-atụnye ya n’ọkụ ka ọ bụrụ nkụ.+ Ọkụ ahụ ga-ere isi ya abụọ, etiti ya achanwụọkwa.+ À ga-eji ya arụ ọrụ ọ bụla? 5 Lee! Mgbe ọkụ na-ereghị ya, a naghị eji ya arụ ọrụ ọ bụla, ma ya fọdụzie mgbe ọkụ rere ya, o wee chanwụọ, a pụghị iji ya arụkwa ọrụ!”+
6 “N’ihi ya, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka osisi vaịn nke dị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa, bụ́ nke m tụnyeworo n’ọkụ ka ọ bụrụ nkụ, otú ahụ ka m meworo ndị bi na Jeruselem.+ 7 Echewo m ihu megide ha.+ N’ọkụ ka ha si pụta, ma ọkụ ahụ ga-erepịa ha.+ Unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova, mgbe m ga-eche ihu ime ha ihe.’”+
8 “‘M ga-emekwa ka ala ahụ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi na ha emewo omume ekwesịghị ntụkwasị obi,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”