46 Pọl na Banabas wee kwuo okwu n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mkpa na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ebe ọ bụ na unu na-ajụ ya,+ ebe ọ bụkwa na unu na-ewere onwe unu ná ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, lee! anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+
11 Ya mere ana m ajụ, sị, Hà sụrụ ngọngọ wee daa+ kpamkpam? Tụfịakwa! Kama site n’ụkwụ ha zọhiere,+ a na-azọpụta ndị mba ọzọ,+ ka e wee kpalie ha ikwo ekworo.+