24 N’ikpeazụ, Josef sịrị ụmụnne ya: “Anwụwala m; ma Chineke aghaghị iche ihu ya n’ebe unu nọ,+ ọ ga-akpọpụta unu n’ala a wee kpọga unu n’ala ọ ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha.”+
6 O wee gaa n’ihu ịsị: “Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke Ebreham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.”+ Mozis wee wepụ ihu ya, n’ihi na egwu tụrụ ya ile ezi Chineke anya.
26 Ma banyere ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a ga-akpọlite, ọ̀ bụ na unu agụghị n’akwụkwọ Mozis, n’ihe e dere banyere osisi ogwu ahụ, otú Chineke si gwa ya, sị, ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb’?+
37 Ma ọbụna Mozis mere ka a mara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, n’ihe e dere banyere osisi ogwu+ ahụ, mgbe ọ kpọrọ Jehova ‘Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+