19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya.+ Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa,+ kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+
17 Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie, ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,+ ma ọ bụrụhaala na anyị na ya atakọọ ahụhụ+ ka e wee mee ka anyị na ya nwekọọ ebube.+