2 Ndị Kọrịnt 5:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla na Kraịst dị n’otu, ọ bụ ihe e kere ọhụrụ;+ ihe ochie agafewo,+ lee! ọ bụ ihe ọhụrụ dị ugbu a.+ Ndị Galeshia 6:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 N’ihi na ibi úgwù abụghị ihe ọ bụla, ebighị úgwù abụghịkwa,+ ma ihe e kere ọhụrụ+ nwere ihe ọ bụ. Ndị Efesọs 3:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 ka o wee jiri ike sitere na mmụọ+ ya mee ka unu dị ike ná mmadụ ahụ unu bụ n’ime,+ dị ka ebube ya dị ukwuu si dị,+ Ndị Kọlọsi 3:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 ma yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ,+ nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo+ nke Onye ahụ kere ya si dị. 1 Jọn 3:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Anyị maara na anyị esiwo n’ọnwụ gafere ná ndụ,+ n’ihi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.+ Onye na-ahụghị ụmụnna ya n’anya ka nọ n’ọnwụ.+
17 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla na Kraịst dị n’otu, ọ bụ ihe e kere ọhụrụ;+ ihe ochie agafewo,+ lee! ọ bụ ihe ọhụrụ dị ugbu a.+
16 ka o wee jiri ike sitere na mmụọ+ ya mee ka unu dị ike ná mmadụ ahụ unu bụ n’ime,+ dị ka ebube ya dị ukwuu si dị,+
10 ma yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ,+ nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo+ nke Onye ahụ kere ya si dị.
14 Anyị maara na anyị esiwo n’ọnwụ gafere ná ndụ,+ n’ihi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.+ Onye na-ahụghị ụmụnna ya n’anya ka nọ n’ọnwụ.+