17 bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ,+ nke ụwa na-apụghị inweta,+ n’ihi na ọ dịghị ahụ ya, ọ maghịkwa ya. Unu maara ya, n’ihi na ọ na-adịgide n’ebe unu nọ, ọ dịkwa n’ime unu.+
14 Ma onye anụ ahụ́ na-achị adịghị anabata ihe ndị metụtara mmụọ Chineke, n’ihi na ha bụụrụ ya ihe nzuzu; ọ pụghịkwa ịmara ha,+ n’ihi na a na-enyocha ha n’ụzọ ime mmụọ.
16 Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,+ ọ bara uru iji ya zie ihe,+ iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị,+ iji ya mee ka ihe guzozie,+ na iji ya nye ọzụzụ+ n’ezi omume,