8 Ma ọ bụrụ na ọ daa ogbenye nke na ọ gaghị akwụli ọnụ ahịa e kpebiri,+ ọ ga-eme ka onye ahụ guzo n’ihu onye nchụàjà, onye nchụàjà ga-ekwu ihe ọ ga-akwụ.+ Onye nchụàjà ga-ekwu ihe ọ ga-akwụ dabere n’ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụli.+
10 Ị ga-emekwara Jehova bụ́ Chineke gị ememme izu,+ na-adabere n’onyinye afọ ofufo i ji bụ́ nke ị ga-enye, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị.+
43 Ya mere, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya wee sị ha: “N’ezie, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ihe ndị niile ahụ na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego tụnyere;+