17 Jizọs zara, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke gbagọkwara agbagọ,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtara m ya ebe a.”
12 Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ,+ ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta+ ya n’ihi ọrụ ọma+ unu nke ha ji anya ha na-ahụ.