27 N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma banyere nnupụisi+ gị na ikwesi olu ike gị.+ Ọ bụrụ na mgbe m ka nọ ndụ ma nọrọ n’etiti unu taa, unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya,+ lezienụ ihe ga-eme mgbe m nwụsịrị!
19 Ọ na-erukwa na mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-atụgharị mewe omume na-eweta mbibi karịa otú ndị nna ha mere site n’isoro chi ọzọ dị iche iche iji na-efe ha ofufe ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na àgwà isi ike ha.+