18 ka i meghee anya ha,+ ka i mee ka ha si n’ọchịchịrị+ gaa n’ìhè,+ sikwa n’ikike Setan+ gakwuru Chineke, ka e wee gbaghara ha mmehie ha,+ ka ha wee nwetakwa ihe nketa+ n’etiti ndị e doro nsọ+ site n’inwe okwukwe n’ebe m nọ.’
17 Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie, ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,+ ma ọ bụrụhaala na anyị na ya atakọọ ahụhụ+ ka e wee mee ka anyị na ya nwekọọ ebube.+