10 Ọ bụ ya mere m ji ede ihe ndị a mgbe m na-anọghị ya, ka ọ ga-abụ, mgbe m ga-anọ ya, ka m ghara ime omume n’aka ike+ dị ka ikike ahụ nke Onyenwe anyị nyere m si dị, iwuli elu,+ ọ bụghịkwa itida etida.
9 onye jidesiri okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi ike n’ihe banyere otú o si eji nkà ezi ihe,+ ka o wee nwee ike iji ozizi na-enye ezi ndụ+ na-adụsi ndị mmadụ ọdụ ike, na-adọkwa ndị na-ekwu okwu nke na-emegide okwu ahụ na-enye ezi ndụ aka ná ntị.+