4 “Ṅaanụ m ntị, unu ndị m; unu mba nke m,+ geenụ m ntị. N’ihi na iwu ga-esi n’ebe m nọ pụta,+ m ga-emekwa ka mkpebi ikpe m dịrị ka ìhè nye ndị dị iche iche.+
2 N’ihi na, lee, ọchịchịrị+ ga-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị ga-ekpuchikwa mba niile; ma Jehova ga-enwukwasị gị dị ka ìhè, a ga-ahụkwa ebube ya n’ahụ́ gị.+