Ọrụ Ndịozi 20:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ+ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.+ 1 Timoti 4:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Otú ọ dị, okwu nke si n’ike mmụọ nsọ kwuru hoo haa na n’oge ikpeazụ,+ ụfọdụ ga-adapụ+ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị si n’aka mmụọ+ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ,+ 2 Timoti 3:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ma mara nke a, na n’oge ikpeazụ,+ a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.+ 2 Pita 2:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa. 2 Pita 3:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 N’ihi na unu bu ụzọ mara nke a, na n’oge ikpeazụ,+ ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa,+ na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha,+
30 ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ+ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.+
4 Otú ọ dị, okwu nke si n’ike mmụọ nsọ kwuru hoo haa na n’oge ikpeazụ,+ ụfọdụ ga-adapụ+ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị si n’aka mmụọ+ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ,+
2 Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.
3 N’ihi na unu bu ụzọ mara nke a, na n’oge ikpeazụ,+ ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa,+ na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha,+