8 kama unu ga-anata ike+ mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà+ m ma na Jeruselem+ ma na Judia dum nakwa na Sameria,+ ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”+
8 Ya mere, ka ihere ịgba àmà banyere Onyenwe anyị ghara ime gị,+ ka ihere mụ onwe m, bụ́ onye mkpọrọ n’ihi Ya, ghara ime gị,+ kama kere òkè nke gị n’ịhụju anya+ n’ihi ozi ọma ahụ site n’ike Chineke.+
9 Mụ onwe m bụ́ Jọn, nwanna unu na onye unu na ya na-eketa òkè ná mkpagbu+ na alaeze+ na ntachi obi+ ná mmekọrịta anyị na Jizọs,+ wee nọrọ n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.+
10 M wee daa n’ala n’ụkwụ ya ka m fee ya ofufe.+ Ma ọ sịrị m: “Kpachara anya! Emela ya!+ Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị ndị nwere ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.+ Fee Chineke,+ n’ihi na ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali ibu amụma.”+