Job
3 Ọ̀ ga-arịọsi gị arịrịọ ike,
Ka ọ̀ ga-agwa gị okwu dị nro?
4 Gị na ya ùnu ga-agba ndụ,
Ka i wee jiri ya mere ohu ruo mgbe a na-akaghị aka?
5 Ị̀ ga-egwusa ya egwu dị ka ọ̀ bụ nnụnụ,
Ka ị̀ ga-ekenye ya eriri ka ụmụ agbọghọ gị were ya gwurie egwu?
6 Ndị ahịa hà ga-eji ihe gbanwere ya?
Hà ga-ekesara ya ndị ahịa?
8 Tụkwasị ya aka gị.
Cheta otú o si ebu agha. Emela ya ọzọ.
9 Lee! Ihe mmadụ na-atụ anya ya n’ebe ọ nọ ga-akụ afọ n’ala.
Anya nkịtị mmadụ hụrụ ya ga-akwada onye ahụ.
11 Ònye buru ụzọ nye m ihe, nke na m kwesịrị ịkwụ ya ụgwọ?+
Ihe niile dị n’okpuru eluigwe dum bụ nke m.+
12 M gaghị ahapụ ịkọ banyere akụkụ ahụ́ ya dị iche iche
Ma ọ bụ banyere ịdị ike ya na otú ọdịdị ahụ́ ya si maa mma.
13 Ònye yipụtụworo ya uwe?
Ònye ga-abanye ya n’ọnụ?
14 Ònye meghetụworo ọnụ ya nke yiri ọnụ ụzọ?
Ezé ya niile na-emenye ụjọ.
15 Ihe na-ebu ya isi bụ akpịrịkpa ya ndị nọ n’ahịrị n’ahịrị,
Bụ́ ndị rapagidere n’ahụ́ ibe ha dị ka è ji mgbá siri ike nyagide ha.
16 Otu na-arapagidesi ike n’ahụ́ ibe ya,
Ọbụna ikuku apụghịkwa isi n’etiti ha gafere.
17 Nke ọ bụla na-arapagidesi ike n’ahụ́ ibe ya;
Ha na-arapara n’ahụ́ ibe ha, a pụghịkwa ikewa ha.
18 Uzere ya na-enwupụta ìhè,
Anya ya dịkwa ka ìhè chi ọbụbọ.
19 Àmụ̀mà na-esi ya n’ọnụ apụta,
Ọbụna ọkụ na-esikwa na ya apụta.
20 Anwụrụ ọkụ na-esi n’oghere imi ya apụta,
Dị ka ekwú ọkụ e ji ahịhịa amị menye ọkụ na ya.
21 Ume ọ na-eku na-eme ka icheku ọkụ nwuru ọkụ,
Ọbụna ire ọkụ na-esikwa ya n’ọnụ apụta.
22 Ike dị n’olu ya,
Obi na-ekoropụ onye guzo n’ihu ya.
23 Akpụkpọ ahụ́ nke dị n’okpuru afọ ya siri ike;
O yiri ihe a wụrụ awụ n’ahụ́ ya, a gaghị ewepụ ha ewepụ.
24 A wụsiri obi ya ike dị ka nkume,
Ee, nkume a wụsiri ike dị ka nne nkume igwe nri.
26 Ọ bụrụ na e jiri mma agha bịakwasị ya, o nweghị ebe mma agha ga-eru ya,
Ube na akụ́ na isi akụ́ enweghịkwa ebe ha ga-eru ya.+
31 Ọ na-eme ka ala ala osimiri na-agbọ agbọ dị ka ite;
Ọ na-eme ka oké osimiri dị ka ite a gbanyere mmanụ otite.
32 Ọ na-eme ka ụzọ o si gafere na-enwu zaa;
Mmadụ echee na ogbu mmiri bụ isi awọ́.
33 E nweghị ihe yiri ya n’elu ala,
Ihe na-adịghị atụ ihe ọ bụla egwu.
34 Ọ na-ahụ ihe ọ bụla nke dị elu.
Ọ bụkwa eze anụ ọhịa niile dị ebube.”