Job
24 “Gịnị mere na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekwughị oge ọ ga-ekpe ikpe,+
Gịnịkwa mere na ndị maara ya ahụghị ụbọchị ya?+
2 E nwere ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ;+
Ha akpụrụwo ìgwè ewu na atụrụ n’ike, ka ha wee zụọ ha.
3 Ha na-achụfu ọbụna oké ịnyịnya ibu nke ụmụ na-enweghị nna;
Ha na-ejichi oké ehi nke nwaanyị di ya nwụrụ dị ka ihe ibé.+
5 Lee! Dị ka ịnyịnya ọhịa+ ndị nọ n’ala ịkpa,
Ha agawo n’ihu n’ọrụ ha, na-achọ ihe oriri.
Ọzara na-enye onye nke ọ bụla nri ụmụ ya ga-eri.
6 N’ọhịa ka ha si eweta nri ọ na-ata,
Ha na-ebukọrọkwa ihe dị n’ubi vaịn onye ajọ omume ngwa ngwa.
9 Ha na-esepụ nwa na-enweghị nna ọnụ n’ara,+
Ha na-ewerekwa ihe onye nọ n’ahụhụ yi n’ahụ́ ka ọ bụrụ ihe ibé.+
11 N’ala ubi nke dị n’etiti mgbidi abụọ ka ha na-anọ n’ehihie;
Ha na-azọchapụta mmanya, ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.+
12 Ude ndị na-anwụ anwụ na-asụ si n’obodo na-adapụta,
Mkpụrụ obi nke ndị e merụrụ ahụ́ nke ukwuu na-eti mkpu enyemaka;+
Chineke adịghịkwa ewere ya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị.+
14 Ogbu mmadụ na-ebili n’ehihie,
Ọ na-egbukwa onye nọ n’ahụhụ na ogbenye;+
N’abalị kwa, ọ na-aghọ onye ohi.+
15 Anya onye na-akwa iko+ anọwo na-echere mgbe chi jiri,+
Na-asị, ‘Ọ dịghị anya ga-ahụ m!’+
Ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
16 Onye ohi egwupuwo ụlọ n’ọchịchịrị;
N’ehihie, ndị ohi na-akpọchigide onwe ha ụzọ.
Ha amaghịkwa ihe bụ́ ìhè ehihie.+
17 N’ihi na ụtụtụ na oké ọchịchịrị+ bụụrụ ha otu ihe,
N’ihi na ha ma ihe bụ́ ụjọ mberede nke a na-atụ n’oké ọchịchịrị.
20 Akpa nwa ga-echefu ya, ikpuru ga-amịcha ya,+
A gakwaghị echeta ya.+
A ga-agbajikwa ajọ omume dị nnọọ ka osisi.+
21 Ya na nwaanyị aga nke na-adịghị amụ nwa na-emekọ ihe,
Ya na nwaanyị di ya nwụrụ,+ bụ́ onye ọ na-adịghị emere ihe ọma, na-emekọkwa ihe.
22 Ọ ga-ejikwa ike ya dọkpụrụ ndị dị ike;
Ọ ga-ebili ọtọ ma ọ gaghị eji ndụ ya n’aka.
24 Ha na-adị elu ruo nwa oge, nke ha agaa,+
E mewokwa ka ha dị ala;+ a na-ebipụ ha dị ka onye ọ bụla ọzọ,
A na-egbujipụkwa ha dị ka oko ọka.
25 Ugbu a, ònye ga-eme m onye ụgha,
Ma ọ bụ mee ka okwu m ghọọ ihe efu?”