9 Ma anyị na-ahụ Jizọs, onye e mere ka ndị mmụọ ozi kara,+ ka e ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma maka na ọ nwụrụ.+ N’ihi amara Chineke, ọ nwụrụ maka mmadụ niile.+
27 Ọ dịghị ka nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ndị na-achụ àjà kwa ụbọchị,+ ha buru ụzọ chụọ maka mmehie nke ha, ha achụzie maka mmehie ndị ọzọ.+ Ọ chụrụ àjà a naanị otu ugboro mgbe o nyefere onwe ya.+
7 Ma, ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye ná nkebi nke abụọ. Ọ na-abanye na ya otu ugboro n’afọ.+ O mekataghị banye ma ọ bụrụ na o jighị ọbara+ o ji achụ àjà maka mmehie ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel+ mere n’amaghị ụma.
12 O jighị ọbara ewu na nke oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya banye n’ebe nsọ ahụ.+ Ọ banyere naanị otu ugboro ma napụta* anyị. Nnapụta a na-adịru ebighị ebi.+
5 Ka Jizọs Kraịst, “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi,”+ “onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ,”+ na “Onye Na-achị ndị eze nke ụwa,”+ meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.