-
Diuterọnọmi 18:10-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 E kwesịghị inwe onye ọ bụla n’ime unu nke na-akpọ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ọkụ iji chụọ àjà,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye ọ bụla nke na-eme anwansi,*+ onye ọ bụla nke na-agba afa ka ọ mata ihe ga-eme n’ọdịnihu,+ dibịa anwansi,+ 11 onye ọ bụla nke na-akọ ndị ọzọ ọgwụ, onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa+ ma ọ bụ onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu+ ase, ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.+ 12 N’ihi na Jehova kpọrọ onye ọ bụla na-eme ihe ndị a asị. Ọ bụkwa n’ihi arụ ndị a ka Jehova bụ́ Chineke unu ji na-achụpụrụ unu mba ndị ahụ.
-