19N’ọnwa nke atọ mgbe ndị Izrel pụtachara n’Ijipt, n’otu ụbọchị ahụ, ha batara n’ala ịkpa Saịnaị. 2 Ha si na Refidim+ kwalie bata n’ala ịkpa Saịnaị ma maa ụlọikwuu n’ala ịkpa ahụ. Ndị Izrel mara ụlọikwuu n’ebe ahụ n’ihu Ugwu Saịnaị.+
4 Ma, Nedab na Abaịhu nwụrụ n’ihu Jehova mgbe ha chụrụ àjà* iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova+ n’ala ịkpa Saịnaị. E nweghị onye n’ime ha mụtara nwa. Ma Elieza+ na Ịtama+ nọ na-arụ ọrụ nchụàjà, ha na Erọn nna ha.