-
Ezikiel 44:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 “‘Ma, ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị, ụmụ Zedọk,+ ndị nọ na-arụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ụlọ nsọ m mgbe ndị Izrel kwụsịrị ife m,+ ga-abịa na-ejere m ozi. Ha ga-eguzokwa n’ihu m jiri abụba+ na ọbara+ na-achụrụ m àjà.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 16 ‘Ọ bụ ha ga na-abata n’ụlọ nsọ m. Ọ bụkwa ha ga na-abịa n’ebe tebụl m dị na-ejere m ozi.+ Ha ga na-arụkwa ọrụ e kwesịrị ịrụrụ m.+
-