21 Malite n’oge ahụ gawa, Jizọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem nakwa na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ata ya ezigbo ahụhụ ebe ahụ. A ga-egbukwa ya, ma, n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.+
22 Ọ bụ mgbe ha zukọtara na Galili ka Jizọs sịrị ha: “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.+23 Ha ga-egbu ya, a ga-akpọlitekwa ya n’ụbọchị nke atọ.”+ Ihe a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu.
3 Ihe kacha mkpa a kụziiri m ka m kụziiri unu, ya bụ, na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.+4 E likwara ya+ ma kpọlite ya+ n’ụbọchị nke atọ+ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.+