-
1 Ndị Kọrịnt 6:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa Alaeze Chineke?+ Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko,*+ ndị na-ekpere arụsị,+ ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko,+ ndị na-ekwe ka ụmụ nwoke ibe ha dinaa ha,+ ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha,*+ 10 ndị ohi, ndị anyaukwu,+ ndị aṅụrụma,+ ndị na-ekwujọ mmadụ,* nakwa ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa Alaeze Chineke.+ 11 Ụfọdụ n’ime unu na-akpabu àgwà ndị a. Ma, Chineke asachaala unu,+ doo unu nsọ,+ kpọọkwa unu ndị ezi omume+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa n’ike mmụọ nsọ.
-
-
Ndị Efesọs 2:3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 N’eziokwu, n’oge gara aga, anyị niile mere omume otú ha si eme, n’ihi na anyị na-eme ihe ọ bụla anụ ahụ́ anyị chọrọ ka anyị mee.+ Anyị na-eme ihe ọ bụla na-atọ anụ ahụ́ anyị ụtọ, na-emekwa ihe ọ bụla batara anyị n’echiche.+ Kemgbe a mụrụ anyị, anyị bụ ndị Chineke kwesịrị iwesa iwe+ otú ndị ọzọ bụ.
-
-
Taịtọs 3:3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 N’ihi na anyịnwa nwere mgbe anyị bụ ndị na-amaghị ihe, ndị na-enupụ isi, ndị e duhiere eduhie, ndị na-agbara ihe dị iche iche na-agụ anyị agụụ na ikpori ndụ ohu, ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ, ndị omume ha jọgburu onwe ya, ndị kpọrọ ibe ha asị.
-