Zekaraya
11 “Lebanọn, meghee ụzọ gị,
Ka ọkụ wee gbaa osisi sida gị.
2 Osisi junipa, tie mkpu ákwá n’ihi na osisi sida adaala.
E bibiela oké osisi dị iche iche.
Osisi ook ndị dị na Beshan, tienụ mkpu ákwá
N’ihi na e bibiela oké ọhịa.
3 Geenụ ntị! Ndị ọzụzụ atụrụ na-eti mkpu ákwá,
N’ihi na e bibiela ebube ha.
Geenụ ntị! Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja,
N’ihi na e bibiela oké ọhịa ndị dị n’akụkụ Osimiri Jọdan.
4 “Jehova bụ́ Chineke m kwuru, sị, ‘Lekọtanụ ndị a, bụ́ ndị dị ka atụrụ a chọrọ igbu egbu.+ 5 Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha,+ ma a naghị ama ha ikpe. Ndị na-ere ha+ na-asịkwa, “Otuto dịrị Jehova n’ihi na m ga-aba ọgaranya.” Ndị na-elekọta ha anaghịkwa emetere ha ebere.’*+
6 “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihi na agaghịzi m emetere ndị bi n’ala a ebere.* N’ihi ya, m ga-eme ka onye ọ bụla megbuo onye agbata obi ya, meekwa ka eze ha megbuo ha. Ha ga-ebibi ala ha, e nweghịkwa onye m ga-anapụta n’aka ha.’”
7 M wee malite ilekọta unu, unu atụrụ ndị a na-emesi ike, atụrụ ndị a ga-egbu egbu.+ Ọ bụ ihe m meere unu. M chịịrị mkpara abụọ, kpọọ otu Ịdị Mma, kpọọkwa nke ọzọ Ịdị n’Otu.+ M wee malite ịzụ ìgwè atụrụ ahụ. 8 M chụpụrụ ndị ọzụzụ atụrụ atọ n’otu ọnwa n’ihi na edilighị m* ihe ha na-eme, ha* kpọkwara m asị. 9 M wee sị: “M ga-akwụsị ịzụ unu ka atụrụ. Nke na-anwụ anwụ, ya nwụọ. Nke a ga-ebibi ebibi, ka e bibie ya. Ndị nke fọrọ afọ, ha rie anụ ibe ha.” 10 M wee were mkpara m bụ́ Ịdị Mma+ gbujisie, si otú ahụ mebie ọgbụgba ndụ mụ na ndị m gbara. 11 E wee mebie ya n’ụbọchị ahụ. Atụrụ ndị ahụ a na-emesi ike, bụ́ ndị nọ na-ele m anya, matara na ọ bụ ihe Jehova kwuru.
12 M wee sị ha: “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, kwụọnụ m ụgwọ ọrụ m. Ọ bụrụkwanụ na ọ dịghị unu mma, hapụwanụ ya.” Ha wee kwụọ m ụgwọ ọrụ m,* mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+
13 Jehova wee sị m: “Wụsa ya n’ebe a na-edowe akụ̀. Ọ bụ otú m dịruru ọnụ n’anya ha.”+ M chịịrị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ wụsa n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova.+
14 M wee gbujisie mkpara m nke abụọ bụ́ Ịdị n’Otu,+ si otú ahụ mee ka Juda na Izrel gharazie ịdị n’otu.+
15 Jehova sịziri m: “Chịrị ngwá ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ na-abaghị uru.+ 16 N’ihi na m na-eme ka e nwee onye ọzụzụ atụrụ n’ala a. Ọ gaghị elekọta atụrụ ndị na-anwụ anwụ.+ Ọ gaghị achọ ndị nke dị obere ma ọ bụ gwọọ ndị nke merụrụ ahụ́+ ma ọ bụ nye ndị nke na-eguzoli ọtọ nri. Kama, ọ na-eri anụ ndị nke gbara agba+ ma hịọpụ atụrụ ndị ahụ ọbụ ụkwụ.+
17 Onye ọzụzụ atụrụ m na-abaghị uru,+ onye na-ahapụ ìgwè atụrụ m,+ ga-ata ahụhụ.
Mma agha ga-egbu ya n’ogwe aka nakwa n’anya aka nri ya.
Ogwe aka ya ga-akpọnwụcha,
Anya aka nri ya ga-akpọkwa.”*