Rut
1 N’oge ndị ikpe+ na-ekpe ikpe, ụnwụ dara n’Izrel. Otu nwoke na nwunye ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ wee si Betlehem,+ nke dị na Juda, gawa ibi n’ala* Moab+ ka ha bụrụ ndị ọbịa n’ebe ahụ. 2 Aha nwoke ahụ bụ Elimelek.* Aha nwunye ya bụ Naomi.* Aha ụmụ ya ndị nwoke abụọ bụ Malọn* na Kilịọn.* Ha bụ ndị Efrata, ya bụ, ndị Betlehem nke dị na Juda. Ha ruru Moab, biri ebe ahụ.
3 Ka oge na-aga, Elimelek di Naomi nwụrụ, ya afọzie Naomi na ụmụ ya ndị nwoke abụọ. 4 E mechaa, ụmụ nwoke ahụ lụrụ ụmụ nwaanyị Moab. Aha otu bụ Ọpa, aha nke ọzọ bụ Rut.+ Ha biri ebe ahụ ihe dị ka afọ iri. 5 Ụmụ nwoke abụọ ahụ, bụ́ Malọn na Kilịọn, mechara nwụọ, nwaanyị ahụ agbara aka ụmụ, gbarakwa aka di. 6 Ya na ndị nwunye ụmụ ya wee si Moab lawa, n’ihi na ọ nọ na Moab nụ na Jehova agọziwela ndị ya, nyewe ha nri.*
7 Naomi na ndị nwunye ụmụ ya wee si ebe ha bi lawa Juda. Ka ha na-aga n’ụzọ, 8 ọ gwara ndị nwunye ụmụ ya ahụ, sị: “Lawanụ. Onye ọ bụla n’ime unu laghachi n’ụlọ nne ya. Ka Jehova hụ unu n’anya,*+ otú unu hụrụ mụ na ụmụ nwoke ndị ahụ nwụrụ anwụ. 9 Ka Jehova mee ka obi ruo onye ọ bụla n’ime unu ala* n’ụlọ di ya.”+ O wee susuo ha ọnụ,* ha ebesiwe ákwá ike. 10 Ha wee na-asị ya: “Mba, anyị ga-eso gị lakwuru ndị gị.” 11 Ma Naomi sịrị ha: “Laghachinụ, ụmụ m. Gịnị mere unu ga-eji soro m? M̀ ka nwere ike ịmụta ụmụ nwoke ndị ga-alụwa unu?+ 12 Laghachinụ, ụmụ m. Lawanụ, n’ihi na emeela m ezigbo agadi ịlụ di. Ọ bụrụgodị na m nwere olileanya ịlụ di n’abalị a, ọ bụrụkwa na m ga-amụtali ụmụ nwoke, 13 ùnu ga-anọ na-eche ha ruo mgbe ha toro? Ùnu ga-anọrọ n’alụghị di n’ihi ha? Mba, ụmụ m, otú ahụhụ Jehova na-ata m si rute unu na-ewute m.”+
14 Ha besiwere ákwá ike ọzọ. E mechaa, Ọpa susuru nne di ya ọnụ lawa. Ma Rut ekweghị ahapụ ya. 15 Naomi wee sị ya: “Nwunye nwanne di gị di ya nwụrụ alakwurula ndị ya na chi ya. Soro nwunye nwanne di gị lawa.”
16 Ma, Rut sịrị ya: “Arịọla m ka m hapụ gị. Arịọkwala m ka m kwụsị iso gị, n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga. Ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ. Ndị gị ga-abụ ndị m. Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.+ 17 Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike* ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.”
18 Mgbe Naomi hụrụ na Rut kpebisiri ike na ọ ga-eso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya ihe ga-eme ka ọ lawa. 19 Ha abụọ wee na-aga ruo mgbe ha rutere Betlehem.+ Ozugbo ha rutere Betlehem, obodo ahụ niile malitere ịgba ghara ghara n’ihi ha. Ụmụ nwaanyị nọkwa na-asị: “Onye a ọ̀ bụ Naomi?” 20 Ma, ọ na-agwa ụmụ nwaanyị ahụ, sị: “Unu akpọzila m Naomi.* Kpọwanụ m Mera,* n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emeela ka ndụ kwụsị ịtọ m ụtọ.+ 21 Aka m juru eju mgbe m pụrụ, ma Jehova emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi, ebe ọ bụ na Jehova emegidela m, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile akpatakwarala m ọdachi?”+
22 Ọ bụ otú a ka Naomi si si Moab lọta,+ ya na Rut nwunye nwa ya, bụ́ onye Moab. Ha rutere Betlehem n’oge a malitere iwe ọka bali n’ubi.+