Job
3 Mmadụ na-abanye n’ebe gbara ọchịchịrị.
Ọ na-abanye n’ime ime itiri na ọchịchịrị,
Na-achọ nkume ndị a dị oké ọnụ.
4 Ọ na-egwunye ígwè n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ bi,
N’ebe e chefuru echefu, n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ na-agaru.
Ụfọdụ ndị na-eke onwe ha ụdọ rịba n’ime ala, ụdọ ejide ha ha ana-arụ ọrụ.
6 N’ebe ahụ ka nkume safaya dị,
Ọlaedo dịkwa n’ájá dị n’ebe ahụ.
7 E nweghị nnụnụ na-eri anụ ma ụzọ e si aga na ya.
Anya égbé ojii ahụbeghị ebe ahụ.
8 E nweghị anụ ọhịa na-akpa ike zọtụrụla ụkwụ na ya.
Ọdụm agatụbeghị na ya.
9 Mmadụ na-akụrisị nkume siri ike.
Ọ na-esi na ntọala ugwu akwatu ugwu.
10 Ọ na-awara mmiri ụzọ+ n’oké nkume.
Anya ya na-ahụ ihe ọ bụla dị oké ọnụ.
11 Ọ na-eji ihe arụbichi ebe mmiri si asọpụta,
Ọ na-agbakwa ihe e zoro ezo n’anwụ.
12 Ma olee ebe a ga-achọta amamihe?+
Oleekwa ebe e si enweta nghọta?+
14 Mmiri miri emi na-asị, ‘Ọ dịghị n’ime m.’
Oké osimiri na-asịkwa, ‘Ọ bụghị m ji ya.’+
16 E nweghị ike iji ọlaedo kacha mma* zụta ya,+
Ma ọ bụkwanụ jiri nkume ọnịks na nkume safaya dị oké ọnụ zụta ya.
17 A gaghị ejili ọlaedo na enyo tụnyere ya.
E nweghịkwa ike iji arịa e ji ezigbo ọlaedo* mee gbanweta ya.+
18 A gaghịdị eji nkume kọral na nkume kristal tụnyere ya,+
N’ihi na akpa nke amamihe juru bara uru karịa nke nkume pel juru.
19 E nweghị ike iji nkume topaz+ si Kush tụnyere ya.
E nweghịdị ike iji ezigbo ọlaedo zụta ya.
20 Ma olee ebe amamihe si abịa?
Oleekwa ebe e si enweta nghọta?+
22 Mbibi na ọnwụ na-asị,
‘Naanị n’akụkọ ka ntị anyị nụrụ gbasara ya.’
23 Ọ bụ Chineke ghọtara otú a ga-esi chọta ya.
25 Mgbe o nyere ifufe ikike ọ ga-eji na-efe*+
Ma tụọ otú mmiri dị iche iche ga-aha,+
26 Mgbe o mere iwu ga na-achị mmiri ozuzo,+
Waakwara oké mmiri ozuzo na égbè eluigwe ụzọ,+
27 Mgbe ahụ, ọ hụrụ amamihe ma kọwaa ya.
O mere ka amamihe dịrị, nwaleekwa ya.
28 O wee sị mmadụ:
‘Lee, ọ bụ ịtụ egwu Jehova bụ amamihe.+
Mmadụ iwepụ aka n’ihe ọjọọ bụkwa nghọta.’”+