Abụ Ọma
AKWỤKWỌ NKE ISE
(Abụ Ọma 107-150)
107 Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
O si ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ma n’ebe ọdịda anyanwụ,
Ma n’ebe ugwu ma n’ebe ndịda kpọkọta ha.+
4 Ha wagharịrị n’ala ịkpa, n’ọzara.
Ha ahụghị ụzọ ha ga-esi gaa n’obodo ha ga-ebi.
5 Agụụ gụrụ ha, mmiri gụkwara ha.
Ezigbo ike gwụrụ ha.*
6 Ha nọ na-ebesara Jehova ákwá mgbe ha na-ata ahụhụ.+
Ọ napụtara ha ná nsogbu ha nọ na ya.+
9 N’ihi na o nyela ndị mmiri na-agụ mmiri.
O jirikwala ihe ọma dị iche iche nyejuo ndị* agụụ na-agụ afọ.+
10 Ụfọdụ bibu n’oké ọchịchịrị,
Bụ́ ndị mkpọrọ a na-emekpa ahụ́, ndị a tụkwara ịga.
11 N’ihi na ha nupụrụ isi n’ihe Chineke kwuru.
Ha ledara ndụmọdụ Onye Kacha Elu anya.+
12 N’ihi ya, o mere ka ihe siere ha ike ka ha wee dị umeala n’obi.+
Ha dara, e nweghịkwa onye nyeere ha aka.
13 Ha kpọkuru Jehova ka o nyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ.
Ọ napụtara ha ná nsogbu ha nọ na ya.
18 E nweghịzi nri ọ bụla na-agụ ha agụụ.
Ọ fọrọ obere ka ha nwụọ.
19 Ha na-akpọku Jehova ka o nyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ.
Ọ na-anapụtakwa ha ná nsogbu ha nọ na ya.
20 Ọ na-enye iwu, e wee gwọọ ha.+
Ọ na-anapụtakwa ha n’olulu ebe e ji ha.
23 Ndị ji ụgbọ mmiri aga n’oké osimiri,
Ndị na-azụ ahịa n’elu nnukwu mmiri,+
24 Ha ahụla ọrụ Jehova
Nakwa ihe ndị dị ebube o kere n’oké osimiri,+
25 Otú okwu o kwuru si eme ka oké ifufe malite ife,+
Meekwa ka e nwee ebili mmiri n’oké osimiri.
26 Ebili mmiri na-ebugoru ha na mbara igwe.
Ọ na-atụbakwa ha n’ala ala osimiri.
Obi na-alọ ha mmiri n’ihi ọdachi chọrọ ịdakwasị ha.
27 Ha na-aṅagharị, na-adagharịkwa ka ndị mmanya na-egbu,
E nweghịzi uru ihe niile ha ma gbasara ịkwọ ụgbọ bara.+
29 Ọ na-eme ka oké ifufe kwụsị ife.
Ebili mmiri na-adajụ.+
30 Ha na-aṅụrị ọṅụ mgbe ihe niile a dara jụụ,
Ọ na-edurukwa ha gaa n’ebe ha bu n’obi ịkwụsị ụgbọ ha.
33 Ọ na-eme ka osimiri ghọọ ọzara,
Ọ na-eme ka isi mmiri ghọọ ala kpọrọ nkụ,+
34 Ọ na-emekwa ka ala nke na-eme nri ghọọ ala nnu nke na-abaghịzi uru,+
N’ihi ihe ọjọọ nke ndị bi na ya na-eme.
38 Ọ na-agọzi ha, ha adịzie nnọọ ọtụtụ.
Ọ naghị ekwe ka anụ ụlọ ha dị ole na ole.+
39 Ma n’ihi mmegbu a na-emegbu ha na ọdachi na-adakwasị ha na uju ha na-eru,
Ha na-adị ole na ole ọzọ, a na-emechukwa ha ihu.
42 Ndị ezi omume na-ahụ ihe ndị a ṅụrịa ọṅụ.+
Ma a ga-emechi ọnụ ndị ajọ omume niile.+