Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 5
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • A ga-akpọpụ onye na-adịghị ọcha iche (1-4)

      • Mmadụ ikwupụta mmehie na ịkwụ ụgwọ ma ikpe ma ya (5-10)

      • Mmiri e ji achọpụta ma nwaanyị ọ̀ gbaala n’èzí (11-31)

Ọnụ Ọgụgụ 5:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 13:45, 46
  • +Le 15:2
  • +Le 22:4; Ọg 19:11

Ọnụ Ọgụgụ 5:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:22
  • +Ọp 25:8; Le 26:11

Ọnụ Ọgụgụ 5:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 5:1, 17

Ọnụ Ọgụgụ 5:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Ha.”

  • *

    Na Hibru, “ha.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 5:5; Jos 7:19; Jes 5:16
  • +Le 6:4, 5

Ọnụ Ọgụgụ 5:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu ebe a bụ ma ọ bụrụ na onye o mejọrọ anwụọla.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 5:16; 6:6, 7; 7:7

Ọnụ Ọgụgụ 5:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 6:14, 17; 7:1, 6; 10:12, 13
  • +Ọp 29:27, 28; Ọg 18:8; Di 18:3; Ezi 44:29; 1Kọ 9:13

Ọnụ Ọgụgụ 5:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ onye nchụàjà ka a na-ekwu.

Ọnụ Ọgụgụ 5:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 18:20; Di 5:18

Ọnụ Ọgụgụ 5:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Ọnụ Ọgụgụ 5:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 17:10; Hib 13:4

Ọnụ Ọgụgụ 5:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 5:15, 25
  • +Ọg 5:22, 24

Ọnụ Ọgụgụ 5:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “kemgbe ị nọ n’okpuru di gị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 7:2

Ọnụ Ọgụgụ 5:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 18:20; 1Kọ 6:9, 10

Ọnụ Ọgụgụ 5:21

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ so.”

  • *

    O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị.

  • *

    Ma ọ bụ “mịkpọọ.” O nwere ike ịpụta na nwaanyị ahụ agaghịzi amụ nwa.

Ọnụ Ọgụgụ 5:22

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị.

  • *

    Ma ọ bụ “mịkpọọ.” O nwere ike ịpụta na nwaanyị ahụ agaghịzi amụ nwa.

  • *

    Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ! Ka ọ dị otú ahụ!”

Ọnụ Ọgụgụ 5:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 5:15

Ọnụ Ọgụgụ 5:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 2:9

Ọnụ Ọgụgụ 5:27

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị.

  • *

    Ma ọ bụ “ga-amịkpọ.” O nwere ike ịpụta na nwaanyị ahụ agaghịzi amụ nwa.

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2004, p. 24

Ọnụ Ọgụgụ 5:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 5:14, 15

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 5:2Le 13:45, 46
Ọnụ Ọgụ. 5:2Le 15:2
Ọnụ Ọgụ. 5:2Le 22:4; Ọg 19:11
Ọnụ Ọgụ. 5:3Ọg 19:22
Ọnụ Ọgụ. 5:3Ọp 25:8; Le 26:11
Ọnụ Ọgụ. 5:6Le 5:1, 17
Ọnụ Ọgụ. 5:7Le 5:5; Jos 7:19; Jes 5:16
Ọnụ Ọgụ. 5:7Le 6:4, 5
Ọnụ Ọgụ. 5:8Le 5:16; 6:6, 7; 7:7
Ọnụ Ọgụ. 5:9Le 6:14, 17; 7:1, 6; 10:12, 13
Ọnụ Ọgụ. 5:9Ọp 29:27, 28; Ọg 18:8; Di 18:3; Ezi 44:29; 1Kọ 9:13
Ọnụ Ọgụ. 5:13Le 18:20; Di 5:18
Ọnụ Ọgụ. 5:16Jer 17:10; Hib 13:4
Ọnụ Ọgụ. 5:18Ọg 5:15, 25
Ọnụ Ọgụ. 5:18Ọg 5:22, 24
Ọnụ Ọgụ. 5:19Ro 7:2
Ọnụ Ọgụ. 5:20Le 18:20; 1Kọ 6:9, 10
Ọnụ Ọgụ. 5:25Ọg 5:15
Ọnụ Ọgụ. 5:26Le 2:9
Ọnụ Ọgụ. 5:29Ọg 5:14, 15
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 5:1-31

Ọnụ Ọgụgụ

5 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ndị niile na-arịa ekpenta+ na ndị niile ihe na-agbapụta n’ahụ́+ nakwa ndị niile na-adịghị ọcha maka na ha metụrụ onye nwụrụ anwụ* aka.+ 3 Ma hà bụ ụmụ nwoke ma hà bụ ụmụ nwaanyị, unu ga-akpọpụ ha. Unu ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ha ka ha ghara imerụ+ ụlọikwuu nke ndị m binyeere.”+ 4 N’ihi ya, ndị Izrel mere otú ahụ wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ ha. Ndị Izrel mere nnọọ otú Jehova gwara Mosis.

5 Jehova wee gwa Mosis, sị: 6 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị emee mmehie ọ bụla ndị mmadụ na-eme ma mehie Jehova, ikpe amala onye* ahụ.+ 7 Ọ* ga-ekwupụta+ mmehie o* mere ma kwụchaa ụgwọ o kwesịrị ịkwụ maka ikpe mara ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ụgwọ ahụ.+ Ọ ga-enye ya onye o mejọrọ. 8 Ma ọ bụrụ na onye o mejọrọ enweghị onye ikwu ọ ga-akwụ ụgwọ ahụ,* a ga-ewegara ya Jehova. Ọ ga-abụzi nke onye nchụàjà, ya na ebule a ga-eji chụọ àjà ikpuchiri ya mmehie.+

9 “‘Onyinye ọ bụla dị nsọ+ ndị Izrel wetaara onye nchụàjà ga-abụ nke onye nchụàjà.+ 10 Ihe ndị dị nsọ onye nchụàjà natara onye ọ bụla ga-abụ nke ya.* Ihe ọ bụla onye ọ bụla nyere onye nchụàjà, ihe ahụ ga-abụ nke onye nchụàjà ahụ.’”

11 Jehova gwakwara Mosis, sị: 12 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ihe a ka a ga-eme ma ọ bụrụ na nwunye mmadụ emehie wee gbaa n’èzí, 13 ya na nwoke ọzọ enwee mmekọahụ,+ ma di ya amaghị, a chọpụtaghịkwa ihe o mere, o wee merụọ onwe ya, ma e nweghị onye gbara akaebe ihe o mere, e jideghịkwa ya: 14 Ma di ya ọ̀ na-ekwosa ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbaala n’èzí mgbe nwaanyị ahụ merụrụla onwe ya, ma di ya ọ̀ na-ekwosa ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbaala n’èzí mgbe nwaanyị ahụ na-emerụbeghị onwe ya, 15 nwoke ahụ ga-akpọrọ nwunye ya kpọtara onye nchụàjà, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka bali ọ ga-enye maka nwunye ya. Ọ gaghị awụsa ya mmanụ ma ọ bụ tụkwasị ya frankinsens n’ihi na ọ bụ àjà ọka ekworo, àjà ọka nke na-eme ka e cheta onye ikpe mara.

16 “‘Onye nchụàjà ga-akpọta nwaanyị ahụ ma mee ka o guzo n’ihu Jehova.+ 17 Onye nchụàjà ga-eji ite ụrọ kuru mmiri nsọ. Onye nchụàjà ga-ekporo ájá n’ala ụlọikwuu ahụ kponye n’ime mmiri ahụ. 18 Onye nchụàjà ga-eme ka nwaanyị ahụ guzo n’ihu Jehova. Ọ ga-atọsa ntutu isi nwaanyị ahụ ma dọkwasị àjà ọka ahụ e ji echeta onye ikpe mara, ya bụ, àjà ọka ekworo,+ n’ọbụ aka abụọ nwaanyị ahụ. Onye nchụàjà ga-ebu mmiri ahụ na-elu ilu e ji abụ mmadụ ọnụ n’aka nke ya.+

19 “‘Onye nchụàjà ga-eme ka nwaanyị ahụ ṅụọ iyi. Ọ ga-asị nwaanyị ahụ: “Ọ bụrụ na e nweghị nwoke ọzọ gị na ya nwere mmekọahụ kemgbe ị lụrụ di,*+ ọ bụrụkwa na i mehiebeghị wee merụọ onwe gị, ka mmiri a na-elu ilu e ji abụ mmadụ ọnụ ghara ime gị ihe ọ bụla. 20 Ma ọ bụrụ na i mehiela kemgbe ị lụrụ di wee merụọ onwe gị, gị na nwoke ọzọ enwee mmekọahụ,—”+ 21 Onye nchụàjà ga-eme ka nwaanyị ahụ ṅụọ iyi.* Onye nchụàjà ga-asịkwa nwaanyị ahụ: “Ka Jehova mee ka ị bụrụ onye ndị obodo ha na-abụ ọnụ na onye ha ga-eji na-aṅụ iyi ma Jehova mee ka apata ụkwụ* gị dapụ,* meekwa ka afọ gị zaa. 22 Mmiri a e ji abụ mmadụ ọnụ ga-abanye n’eriri afọ gị ka o mee ka afọ gị zaa, meekwa ka apata ụkwụ* gị dapụ.”* Nwaanyị ahụ ga-asị: “Amen! Amen!”*

23 “‘Onye nchụàjà ga-ede ihe ndị a nwaanyị ahụ ṅụrụ n’iyi n’akwụkwọ ma sabanye ha n’ime mmiri ahụ na-elu ilu. 24 Ọ ga-emezi ka nwaanyị ahụ ṅụọ mmiri ahụ na-elu ilu nke e ji abụ mmadụ ọnụ. Mmiri ahụ e ji abụ mmadụ ọnụ ga-abanye n’afọ ya ma gbuo ya mgbu. 25 Onye nchụàjà ga-eburu àjà ọka ekworo+ ahụ n’aka nwaanyị ahụ ma fegharịa ya n’ihu Jehova. Ọ ga-ewetakwa ya nso n’ebe ịchụàjà. 26 Onye nchụàjà ga-ekporo àjà ọka ga-eju ọbụ aka ya ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà e wetara. Ọ ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.+ Ọ ga-emezi ka nwaanyị ahụ ṅụọ mmiri ahụ. 27 Mgbe o mere ka nwaanyị ahụ ṅụọ mmiri ahụ, ọ bụrụ na nwaanyị ahụ merụrụ onwe ya ma gbaa n’èzí, mmiri ahụ e ji abụ mmadụ ọnụ ga-abanye n’afọ ya ma gbuo ya mgbu. Afọ ya ga-aza, apata ụkwụ* ya ga-adapụkwa.* Nwaanyị ahụ ga-abụzi onye ndị obodo ha ji abụ mmadụ ọnụ. 28 Ma, ọ bụrụ na nwaanyị ahụ emerụghị onwe ya, ya abụrụ na ọ dị ọcha, ihe ndị ahụ agaghị eme ya. Ọ ga-enwe ike ịdị ime, nweekwa ike ịmụ nwa.

29 “‘Ihe a bụ iwu e nyere gbasara ekworo+ ma ọ bụrụ na nwaanyị mehiere wee merụọ onwe ya mgbe ọ nọ na di 30 ma ọ bụ ma ọ bụrụ na nwoke na-ekwosa nwunye ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbara n’èzí. Nwoke ahụ ga-eme ka nwunye ya guzo n’ihu Jehova. Onye nchụàjà ga-emekwa nwaanyị ahụ ihe niile e kwuru n’iwu a. 31 Nwoke ahụ ga-enwere onwe ya. Ikpe agaghị ama ya. Ma nwunye ya ga-eburu ihe o metara.’”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya