Ilu
21 Obi eze dị ka iyi n’aka Jehova.+
Ọ na-eme ka ọ gaa ebe ọ bụla ọ chọrọ.+
5 Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya,*+
Ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.+
6 Akụ̀ a ghara ụgha kpata
Dị ka alụlụụ na-anaghị anọte aka, dịrịkwa ka ọnyà nke nwere ike igbu mmadụ.*+
10 Ihe ọjọọ na-agụsi onye ajọ omume agụụ ike.+
Ọ naghị emetere onye agbata obi ya ebere.+
11 A taa onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-amaghị ihe amara ihe.
Onye ma ihe ghọtakwuo ihe, ọ na-amụta ihe.*+
12 Chineke bụ́ Onye Ezi Omume na-ahụ ụlọ onye ajọ omume.
Ọ na-eme ka ọdachi dakwasị ndị ajọ omume.+
13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ebe
Ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+
17 Onye oriri na nkwari na-amasịkarị ga-ada ogbenye.+
Onye na-anaghị eji anya ahụ mmanya na mmanụ agaghị aba ọgaranya.
18 A na-eji onye ajọ omume agbapụta onye ezi omume,
A ga-akpụrụkwa onye aghụghọ kama ịkpụrụ onye ezi omume.+
19 Ọ ka mma na mmadụ bi n’ala ịkpa
Kama ya na nwaanyị na-esekarị okwu, nke na-ewekwa iwe ọsọ ọsọ, ga-ebi.+
21 Onye na-agbalị ime ezi omume ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya
Ga-adị ndụ. Ọ ga-abụ onye ezi omume, a ga na-akwanyekwara ya ùgwù.+
22 Onye ma ihe nwere ike ịrị mgbidi obodo ndị dike
Ma bata n’obodo ha kwatuo ebe a rụsiri ike nke ha tụkwasịrị obi.+
24 A na-asị na mmadụ dị mpako nakwa na ọ na-etu ọnụ
Ma ọ bụrụ na ọ naghị eche echiche eme ihe maka na onwe ya na-ebu ya isi.+
26 Anyaukwu na-eme ka ihe ọ na-eche mgbe niile bụrụ ihe ọ ga-enwetakwu,
Ma onye ezi omume na-enye ndị mmadụ ihe, e nweghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+
28 Onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ga-ala n’iyi,+
Ma a ga-anabata akaebe onye na-ege ntị nke ọma gbara.
30 E nweghị amamihe ma ọ bụ nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ ọ bụla ga-aghasali nzube Jehova.+