Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/11 p. 8-9
  • ‘Eziokwu Ga-eme Ka Unu Nwere Onwe Unu’!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Eziokwu Ga-eme Ka Unu Nwere Onwe Unu’!
  • Teta!—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eziokwu Baịbụl Mere Ka Ha Nwere Onwe Ha!
  • Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Krismas—N’ihi Gịnị Ka E Ji Eme Ya Ọbụna n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-atụ Anya Ya n’Oge Krismas
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2011
g 1/11 p. 8-9

‘Eziokwu Ga-eme Ka Unu Nwere Onwe Unu’!

IHE a Jizọs Kraịst kwuru, nke dị na Baịbụl na Jọn 8:32, bụ eziokwu doro anya. Eziokwu Baịbụl na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ na nkwenkwe ụgha na omenala ndị na-adịghị amasị Chineke nakwa n’ihe ndị ga-akpatara anyị nsogbu. Ihe anyị chọrọ ịkọ ugbu a bụ otú eziokwu Baịbụl si mee ka ndị si ná mba dị iche iche nwere onwe ha pụọ n’ihe ụfọdụ a na-eme n’oge Krismas, bụ́kwanụ ihe ndị na-akpatara ha nsogbu.

Eziokwu Baịbụl Mere Ka Ha Nwere Onwe Ha!

Ajentina Oscar kwuru, sị: “Ezinụlọ anyị apụọla ná nsogbu ndị iri oké nri na ịṅụbiga mmanya ókè na-akpatara anyị, pụtakwa ná nsogbu ịgbaziri ego anyị ga-eji azụ onyinye na-akpatara anyị.”

Mgbe Mario matara otú Krismas si bido, o nwere ezigbo obi ụtọ, nke a mekwara ka ọ kpọọ Krismas ‘ememme ụgha.’ Ọ sịrị: “Ugbu a, obi na-adị m ụtọ ma m nye ndị ọzọ onyinye mgbe ọ bụla ọ dabara n’afọ nakwa mgbe m ji ego ịzụta ihe m ga-enye ha.”

Kanada Elfie sịrị: “Inye ndị ọzọ onyinye na-amasị m, ọ na-amasịkwa m ma e nye m onyinye. Ma ọ naghị amasị m ma mmadụ nye m onyinye n’ihi na o weere na iwu ji ya inye m ya. Mgbe ezinụlọ anyị kwụsịrị ịgba Krismas, ahụ́ bịara ruo anyị ala!”

Otu nwa nwaanyị Elfie, aha ya bụ Ulli, sịrị: “Mgbe ndị mụrụ m kwụsịrị ịgba Krismas, ọ na-abụ ha nọkata ha enye anyị onyinye mgbe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ hazie egwuregwu ụfọdụ dị ụtọ. Ọ na-atọgbu anyị atọgbu! Ọ bụrụ na ụmụ klas anyị ajụọ anyị ihe mere ndị mụrụ anyị ji nye anyị onyinye, anyị na-eji obi ụtọ agwa ha na ha nọkatara nye anyị ya! Ma, mgbe ndị mụrụ anyị kwụsịrị iso ndị ikwu anyị agba Krismas n’ihi ihe ndị ha mụtara na Baịbụl, ndị ikwu anyị malitere inye ha nsogbu. Ma ha nọgidesiri ike na-eme ihe Baịbụl kwuru. Otú ha si nọgidesie ike na-efe Jehova Chineke nyeere m aka imewe ka ha.”

Silvia kwuru na mgbe ya kwụsịrị ịgba Krismas, o yiri ka e buturu ya ibu dị arọ. Ọ sịrị: “Ahụ́ bịara ruo m ala mgbe m kwụsịrị ya! Ama m na m na-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ, ichetakwa na m na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-enye m obi ụtọ karịa Krismas ọ bụla m ga-agba.”

Kenya Peter sịrị: “Mgbe m na-agba Krismas, ana m agbaziri nnukwu ego iji zụta ihe ndị m ga-enye ndị mmadụ nakwa iji sijuo nri ebe niile. Ma, ka m nwee ike kwụchaa ego ndị m gbaziiri, ana m arụ ọrụ oge niile nke mekwara na mụ na ndị ezinụlọ m adịghị anọkarị. Ugbu a, eziokwu Baịbụl emeela ka m nwere onwe m!”

Carolyne sịrị: “Ana m enye ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m onyinye mgbe ọ bụla m chọrọ inye ha, hanwa na-enyekwa m. A sị m kwuo, ọ kacha mma inye mmadụ onyinye mgbe o si gị n’obi nakwa inye ya mgbe onye ahụ na-anaghị atụ anya ya.”

Japan Hiroshi na Rie kwuru, sị: “E nweghị oge ụmụ anyị na-atụ anya na anyị ga-enyerịrị ha onyinye, ha anaghịkwa ewere ihe anyị nyere ha ka ihe anyị kwesịrị ime. Ihe na-atọ anyị bụ́ ndị mụrụ ha ụtọ bụ na ha amụtala na mmadụ kwesịrị inye ihe mgbe o si ya n’obi.”

Keiko sịrị: “Anyị niile n’ezinụlọ anyị na-agbabu Krismas. N’oge ahụ, ọ na-abụ nwa anyị nwoke lakpuo, mụ na di m ezoro ezoro gaa dowere ya ihe anyị zụtaara ya n’akụkụ ebe o dina. Chi bọọ, ihe anyị na-agwa ya bụ: ‘Ọ bụ fada Krismas wetaara gị onyinye a, n’ihi na ị bụ ezigbo nwa.’ Mgbe m mụtara eziokwu banyere Krismas, akọọrọ m ya nwa m nwoke. O bewere ákwá mgbe ọ chọpụtara na anyị na-aghọgbu ya kemgbe. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na ihe ndị anyị chere dị mma anyị na-eme n’oge Krismas abụghị ezigbo ihe. Kama, ihe anyị nọ na-eme bụ ịkụziri nwa anyị ụgha, o wutekwara m na m ghọgburu nwa m nwoke.”

Filipinz Dave sịrị: “Anyị agaghị akọchali obi ụtọ anyị na-enweta n’ihi eziokwu Jehova na-akụziri anyị bụ́ nke anyị na-amụta na Baịbụl. O nwee onyinye ọ bụla anyị nyere ndị mmadụ, anyị anaghị atụ anya ka ndị ahụ nyekwa anyị. Ihe ọ bụla anyị nyere na-esi anyị n’obi.”

Ndị a niile anyị kwuru okwu ha ebe a bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ihe dị ka nde mmadụ asaa ndị eziokwu Baịbụl ha mụtara mere ka ha nwere onwe ha. Ma, nke ka nke bụ na ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl, anyị na-eme ka obi Chineke ṅụrịa. (Ilu 27:11) Jizọs Kraịst sịrị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Ọ bụrụ na Chineke eleba anya n’obi gị, ọ̀ ga-achọpụta na ị bụ onye chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu? Anyị na-atụ anya na ọ ga-achọpụta na ị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu!

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị Kraịst na-enye ihe n’ihi na o si ha n’obi, ha na-enyekwa ya n’oge ọ bụla ọ dabara n’afọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya