Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 11/15 p. 14-15
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ONYE KACHA EMESAPỤ AKA
  • “Ọrụ A Dị Ukwuu”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ha Ji Ihe Mafọọrọ Ha Nyere Ụmụnna Ha Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 11/15 p. 14-15
Ebe otu nwaanyị na-etinye kaadị ndọrọ ego n’ígwè ọ ga-esi na ya nye onyinye

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka

JEHOVA bụ Chineke na-emesapụ aka. (Jems 1:17) Ihe niile Jehova kere na-egosi na ọ na-emesapụ aka, ma kpakpando ndị na-eju na mbara igwe n’abalị ma osisi ndị juru n’ụwa.—Ọma 65:12, 13; 147:7, 8; 148:3, 4.

Otú obi si dị́ Devid ụtọ maka ihe Chineke kere mere ka o dee abụ iji too ọrụ aka Jehova. Gụọ Abụ Ọma nke 104, ka ị hụ ma ọ̀ bụ na obi agaghị adị gị otú ọ dị ya. Devid dere, sị: “M ga-abụku Jehova abụ n’oge niile m dị ndụ; m ga-abụku Jehova abụ olu ụtọ n’oge ndụ m niile.” (Ọma 104:33) Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?

ONYE KACHA EMESAPỤ AKA

Jehova chọrọ ka anyị na-emesapụ aka otú ahụ ọ na-eme. Ọ gwakwara anyị ihe mere anyị ga-eji na-emesapụ aka. Buru n’obi ihe Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee. Ọ sịrị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ; ka ha na-arụ ọrụ ọma, ka ha bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, ka ha dịrị njikere inye ndị ọzọ ihe, ka ha na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Tim. 6:17-19.

Mgbe Pọl degaara ọgbakọ dị́ na Kọrịnt akwụkwọ ozi nke abụọ, o kwusiri ike banyere otú anyị kwesịrị isi na-ele inye onyinye anya. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Kọr. 9:7) Pọl kwukwara ndị imesapụ aka na-abara uru. Nke mbụ bụ onye e nyere onyinye, bụ́ onye e gboro mkpa ya. Nke abụọ abụrụ onye nyere onyinye, ya bụ, onye Chineke ga-agọzi nke ukwuu.—2 Kọr. 9:11-14.

Ihe ikpeazụ Pọl kwuru banyere onyinye n’akwụkwọ ozi ahụ bụ ihe kacha gosi na Chineke na-emesapụ aka. Ọ sịrị: “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.” (2 Kọr. 9:15) O doro anya na ihe só n’onyinye Pọl kwuru okwu ya bụ ihe ọma niile Chineke si n’aka Jizọs Kraịst na-emere ndị ya. Uru ọ bara abụghị ihe e ji ọnụ akọ.

Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile Jehova na Ọkpara ya meere anyị nakwa ihe ndị ha ga-emere anyị n’ọdịnihu? Otu ụzọ bụ iji oge anyị, ike anyị, na akụ̀ anyị na-akwado ofufe Jehova, ma ihe anyị ga-emeli ọ̀ dị ntakịrị ma ò buru ibu.—1 Ihe 22:14; 29:3-5; Luk 21:1-4.

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Kpebiri Isi Na-enye Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ

Ọtụtụ ndị taa na-eme ụdị ihe ahụ e mere n’oge Pọl onyeozi. Ha ‘na-ewepụta ihe,’ ya bụ, kpebie ego ole ha chọrọ inye n’onyinye, ma tinye ya n’igbe e dere “Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ.” (1 Kọr. 16:2) Kwa ọnwa, ọgbakọ ọ bụla na-ewekọta ego ha nwetara n’igbe ahụ ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya zigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba o bi ego ọ chọrọ iji nye onyinye. Ị chọọ ịmata aha ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba i bi, jụọ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ahụ i bi. I nwere ike inweta adres alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.jw.org/ig. Ụdị ihe ndị i nwere ike iji aka gị zigara alaka ụlọ ọrụ bụ:

ONYINYE

  • Mmadụ nwere ike isi n’Ịntanet ma ọ bụ jiri kaadị ndọrọ ego kwụnyere anyị ego o dewere n’ụlọ akụ̀. N’alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ, e nwere ike isi na jw.org ma ọ bụ n’adres Ịntanet ọzọ a kpọrọ aha kwụnyere anyị ego.

  • O nwere ike ịbụ ego, ọlaedo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego. E kwesịrị izitekọta ha na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị ahụ bụ onyinye.

EGO I NWERE IKE IWEREGHACHI

  • Mmadụ nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ ego ma kwuo na ya nwere ike iwereghachi ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

  • O kwesịrị izitekọta ya na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ya nwere ike iwereghachi ego ahụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego na ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego, e nwere ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe iji kwado ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. E dere ha n’okpuru ebe a. N’agbanyeghị nke ị họọrọ, biko buru ụzọ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi ka i nwee ike ịmata nke iwu kwadoro ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na mba ọ bụla nwere iwu nke ha, mmadụ kwesịrị ibu ụzọ jụọ ndị ọkàiwu tupu ya ahọrọ ụzọ kacha mma ọ ga-esi nye onyinye.

Ịnshọransị: I nwere ike idenye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba i bi n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego ịnshọransị ma onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego mmadụ ga-enweta ma ọ laa ezumike nká.

Ego E Dowere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ya dị́ n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. Ọ ga-eme ya otú ụlọ akụ̀ dị́ ná mba o bi kwuru ka e si mee ya.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego. Mmadụ nwekwara ike ikwu ka e nye alaka ụlọ ọrụ ihe ndị ahụ ma ya nwụọ.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ala na ụlọ e nwere ike ire ere. Ọ bụrụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya alaka ụlọ ọrụ ma ka biri na ya ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ike Ekpe na Ihe E Nyere Mmadụ Ka O Jide: E nwere ike idenyere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ma ọ bụ ihe ọzọ n’akwụkwọ ike ekpe nke iwu kwadoro. Mmadụ nwekwara ike inye onye ọzọ ihe ka o jide ma dee ka e nye ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ma e mechaa.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, onye chọrọ inye ụdị onyinye a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya