Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/97 p. 3-6
  • Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nletaghachi Na-eduga n’Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • A Chọkwuru—Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Dabere na Jehova Ime Ka Ihe Na-aba Ụba
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Akụkụ nke 11: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 3/97 p. 3-6

Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi

1 Ọ̀ na-atọ gị ụtọ ime nletaghachi? Ọ na-atọ ọtụtụ ndị nkwusa ụtọ. Ọ pụrụ ịbụ na ị tụrụ ụjọ na mbụ, karịsịa mgbe ị na-alaghachi na nke ndị nwe ụlọ bụ́ ndị gosiri nanị ntakịrị mmasị mgbe mbụ a kpọtụụrụ ha. Ma ka ị ‘na-enweta obi ike site na Chineke anyị ikwusa ozi ọma ahụ’ n’ime nletaghachi, ọ pụrụ iju gị anya ịchọpụta otú ọrụ a si dị mfe ma na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. (1 Tesa. 2:2) N’ụzọ dị aṅaa?

2 Otu ihe bụ, e nwere ọdịiche dị mkpa dị n’agbata nletaghachi na ọbịbịa mbụ. A na-eje nletaghachi na nke onye a maara, ọ bụghị onye a na-amabughị, ọ na-adịkarịkwa mfe iso onye a maara nwee mkparịta ụka karịa iso onye a na-amabughị. Banyere ụgwọ ọrụ bara ụba ndị na-abịa site n’ikere òkè n’ọrụ a, nletaghachi pụrụ iduga n’ọmụmụ Bible ebe obibi ndị na-arụpụta ihe.

3 Mgbe anyị na-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-aga ugboro ugboro na nke ndị na-enweghị mmasị mgbe anyị letara ha na mbụ. Mgbe ahụ, gịnị mere anyị ji anọgide na-aga? Anyị na-aghọta na ọnọdụ ndị mmadụ na-agbanwe nakwa na onye yiri ka o nweghị mmasị ma ọ bụ ọbụna na-emegide emegide ná nleta bu ụzọ pụrụ inwe mmasị mgbe ọzọ anyị bịara. N’iburu nke ahụ n’uche, anyị na-akwadebe nke ọma ma na-ekpe ekpere maka ngọzi Jehova ka ihe anyị ga-ekwu ugbu a wee nweta nzaghachi dị mma.

4 Ọ bụrụ na, n’ọrụ ụlọ n’ụlọ anyị, anyị ejiri ọchịchọ obi meere ndị na-enwebughị mmasị ma ọlị nkwusa, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji ọchịchọ obi ọbụna karị laghachi na nke onye ọ bụla gositụrụ mmasị n’ozi Alaeze ahụ?—Ọrụ 10:34, 35.

5 Ọtụtụ n’ime anyị nọ n’eziokwu taa n’ihi na onye nkwusa ji ndidi bịara anyị nletaghachi. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ndị a, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Echiche dị aṅaa ka m mere ka onye nkwusa ahụ nwee? Ànakweere m ozi Alaeze ahụ ozugbo ahụ mgbe mbụ m nụrụ ya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na mụ yiri onye na-enweghị mmasị?’ Anyị kwesịrị inwe obi ụtọ na onye nkwusa ahụ bịaghachiri lere anyị anya dị ka ndị kwesịrị ijere nletaghachi, ‘nweta obi ike site na Chineke,’ bịaghachi, ma gaa n’ihu izi anyị eziokwu ahụ. Olee banyere ndị gositụrụ mmasị na mbụ ma mesịa yie ka ha na-ezere anyị? Àgwà ziri ezi dị mkpa, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.

6 Ka ọ nọ na-agba àmà okporo ámá n’otu isi ụtụtụ, ndị nkwusa abụọ zutere otu nwaada nke kpọ nwa ya. Nwanyị ahụ natara otu magazin ma kpọọ ụmụnna nwanyị ahụ ịbịa n’ụlọ ya na Sunday na-esonụ. Ha bịara n’oge a kara aka, ma onye ahụ nwe ụlọ gwara ha na ya enweghị ohere ikwu okwu. Otú ọ dị, o kwere nkwa ịnọ ya n’izu na-esonụ. Ụmụnna nwanyị ahụ nwere obi abụọ ma ọ ga-emezu nkwa ya, ma nwaada ahụ nọ na-echere ha mgbe ha laghachiri. A malitere ọmụmụ ihe, ọganihu nwanyị ahụ tụkwara n’anya. N’ime mkpirikpi oge, ọ malitere ijechi nzukọ anya na ikere òkè n’ozi ubi. E meela ya baptism ugbu a.

7 Tọọ Ntọala n’Ọbịbịa Mbụ: A na-atọkarị ntọala maka nletaghachi ga-aga nke ọma n’ọbịbịa mbụ. Gee ntị nke ọma n’okwu onye nwe ụlọ. Gịnị ka ha na-agwa gị? Ò nwere mmasị n’okpukpe? Ọ̀ na-enwe nchegbu banyere okwu metụtara ọha na eze? Ò nwere mmasị na sayensị? akụkọ ihe mere eme? gburugburu ebe obibi? Ná mmechi nke ọbịbịa ahụ, ị pụrụ iwelite ajụjụ na-akpasu iche echiche ma kwee nkwa ịtụle azịza Bible mgbe ị laghachiri.

8 Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye nwe ụlọ azaghachi ná nkwa Bible maka ụwa paradaịs, inwekwu nkwurịta okwu n’isiokwu ahụ pụrụ ikwesị ekwesị. Kpọmkwem tupu ị pụọ, ị pụru ịjụ, sị: “Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa a?” Mgbe ahụ kwukwasị: “Ma eleghị anya enwere m ike ịkwụsịtụ mgbe ndị ọzọ so n’ezinụlọ gị nọ n’ụlọ, mgbe ahụkwa apụrụ m igosi gị azịza Bible nye ajụjụ a.”

9 Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosighị mmasị n’isiokwu ọ bụla kpọmkwem, ị pụrụ iwelite otu n’ime ajụjụ ndị dị n’ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị n’azụ peji nke Ozi Alaeze Anyị ma jiri nke ahụ mee ihe dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ maka nkwurịta okwu ọzọ.

10 Nwee Ihe Ndekọ Ziri Ezi: Ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ gị kwesịrị izi ezi ma zuo ezuo. Detuo aha na adres nke onye nwe ụlọ ozugbo ị hapụrụ ụlọ ahụ. Akọla nkọ banyere nọmba ụlọ ahụ ma ọ bụ aha okporo ámá ahụ—nyochaa ihe ọmụma ahụ iji jide n’aka na o ziri ezi. Detuo otú onye ahụ dị. Detuo isiokwu unu kwurịtara, akwụkwọ nsọ ndị ị gụrụ, na akwụkwọ ọ bụla ị hapụrụ, na ajụjụ ị ga-aza mgbe ị laghachiri. Gụnye ụbọchị na oge mbụ ị gara na mgbe ị sịrị ị ga-alaghachi. Ugbu a ihe ndekọ gị zuworo ezu, etufula ya! Debe ya n’ebe dị nchebe ka i wee nwee ike izo aka na ya ma e mesịa. Nọgide na-eche banyere onye ahụ na ihe ị ga-eme mgbe ọzọ ị gara.

11 Mara Ihe Ndị Bụ Ebumnobi Gị: Nke mbụ, site n’ikpo ọkụ na inwe omume enyi, mee ihe nile i nwere ike ime iji mee ka ahụ ruo onye nwe ụlọ ala. Gosi na i nwere mmasị n’ahụ ya kpọmkwem, n’achọghị ịmata ya n’ụzọ na-adịghị mkpa. Ọzọ, chetara ya ajụjụ ọ bụla i welitere ná nleta mbụ gị. Ṅaa ntị nke ọma n’echiche ya, ma kwupụta ezi ekele maka ihe ndị o kwuru. Mgbe ahụ gosi ihe mere echiche Bible ji baa uru. Ọ bụrụ na o kwe mee, duru ya gaa n’echiche yiri ya n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Buru n’uche nke ọma na ebumnobi gị bụ isi ná nletaghachi bụ ịmalite ọmụmụ Bible.

12 Ịga n’ihe kpọmkwem nke akwụkwọ Ihe Ọmụma akpaliwo ọtụtụ n’ime anyị ‘inweta obi ike’ n’ọmụmụ Bible iji gbaa ndị a na-amụrụ ihe ume ije nzukọ dị iche iche na iso nzukọ Jehova na-akpakọrịta. N’oge ndị gara aga, o yiri ka anyị na-echere ruo mgbe ndị mmadụ mụworo ihe ruo nnọọ ogologo oge ụfọdụ tupu a na-akpọ ha òkù iso anyị na-akpakọrịta. Ugbu a, ọtụtụ ndị a na-amụrụ Bible na-eje nzukọ ozugbo ha malitere ịmụ ihe, ha na-enwekwa ọganihu ngwa ngwa karị n’ihi ya.

13 Otu di na nwunye gbaara otu onye ọrụ ibe ha àmà mberede. Mgbe o gosipụtara mmasị n’eziokwu ahụ, ha kpọrọ ya òkù inwe ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. N’otu oge ahụ, ha gwara ya na o kwesịrị ịdị na-eje nzukọ, bụ́ ebe a ga-aza ọtụtụ n’ime ajụjụ ya. Nwoke ahụ ji ọchịchọ obi ya ọ bụghị nanị nakwere ọkpụkpọ òkù ha ịmụ ihe kamakwa mụọ ihe ugboro abụọ n’izu ma malite ijechi nzukọ anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

14 Jiri Broshuọ Bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Na-eme Ihe: Ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke,” anyị natara broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Broshuọ a bara uru n’ịmalitere ndị na-atụ egwu Chineke ọmụmụ Bible n’agbanyeghị otú ha gụruru akwụkwọ. O nwere usoro ihe ọmụmụ zuru ezu, na-agụnye ozizi ndị bụ isi nke Bible. Akwụkwọ ahụ ga-abụ nnọọ ngwá ọrụ dị irè maka inyefe ihe ọmụma Chineke. Ọ na-akọwa eziokwu Bible n’ụzọ doro nnọọ anya ma dị nnọọ mfe nke na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-enwe ike iji ya kụziere ndị ọzọ ihe ndị Chineke chọrọ. Ma eleghị anya, ọtụtụ ndị nkwusa ga-enwe ihe ùgwù nke iduzi ọmụmụ Bible na broshuọ a.

15 Mmadụ ụfọdụ ndị chere na ha enweghị oge ịmụ akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ pụrụ ịdị njikere inwe nnọkọ ndị dị mkpirikpi na-amụ broshuọ bụ́ Na-achọ. Ha ga-enwe obi ụtọ n’ihe ha na-amụta! Nanị na peji abụọ ma ọ bụ atọ, ha ga-achọta azịza nye ajụjụ ndị mmadụ tụgharịworo uche na ha eri ọtụtụ narị afọ: Ònye bụ Chineke? Ònye bụ Ekwensu? Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa? Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee ụzọ ị pụrụ isi chọta ezi okpukpe ahụ? Ọ bụ ezie na broshuọ ahụ na-akọwa eziokwu ahụ n’okwu ndị dị mfe, ozi ya dị nnọọ ike. Ọ tụlere ihe ndị bụ isi nke ndị okenye ga-eso ndị a gaje ime baptism tụleghachi, ọ pụkwara ịrụ ọrụ dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ maka ọmụmụ ihe ka mie emie n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.

16 Iji malite ọmụmụ ihe ná nletaghachi, ị pụrụ ikwu nanị, sị: “Ị̀ maara na site n’iwepụta nanị minit ole na ole, ị pụrụ inweta azịza nye otu ajụjụ dị mkpa nke Bible?” Mgbe ahụ, jụọ ajụjụ dị ná mmalite nke otu n’ime ihe ọmụmụ dị na broshuọ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-akpọtụrụ onye meworo okenye karị, ị pụrụ ikwu, sị: “Anyị maara na n’oge gara aga Jisọs gwọrọ ndị mmadụ. Ma n’ọdịnihu, gịnị ka Jisọs ga-emere ndị ọrịa? ndị agadi? ndị nwụrụ anwụ?” A na-achọta azịza ha n’ihe ọmụmụ nke 5. Onye ji okpukpe kpọrọ ihe pụrụ ịbụ onye a kpaliri mmasị ya site n’ajụjụ bụ́: “Chineke ọ̀ na-anụ ekpere nile?” A zara ya n’ihe ọmụmụ nke 7. Ndị òtù ezinụlọ ga-achọ ịmata: “Gịnị ka Chineke na-achọ n’aka ndị nne na nna na n’aka ụmụ?” Ha ga-achọpụta ka ha na-amụ ihe ọmụmụ nke 8. Ajụjụ ndị ọzọ bụ: “Ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ imerụ ndị dị ndụ ahụ?” nke a kọwara n’ihe ọmụmụ nke 11; “N’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ okpukpe na-azọrọ ịbụ nke Kraịst?” nke a tụlere n’ihe ọmụmụ nke 13; na “Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji bụrụ enyi Chineke?” nke a tụlere n’ihe ọmụmụ nke 16.

17 Nyere Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Aka: Olee maka ndị nwe ụlọ bụ́ ndị na-asụ asụsụ ọzọ? Ọ bụrụ na o kwe mee, e kwesịrị ịkụziri ha ihe n’asụsụ ha kasị mara. (1 Kọr. 14:9) Anyị kwesịrị idetu aha na adres nke ndị dị otú ahụ ma mee ndokwa ka onye nkwusa na-asụ asụsụ ha laghachi ma duziere ha ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na e nweghị ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè dị nso, e nweghịkwa ndị nkwusa nọ n’ógbè ahụ bụ́ ndị pụrụ ịsụ asụsụ nke onye ahụ nwe ụlọ, onye nkwusa ahụ pụrụ ịgbalị ịmụrụ onye ahụ nwe ụlọ ihe, na-eji broshuọ bụ́ Na-achọ eme ihe n’asụsụ abụọ ahụ.

18 Otu onye nkwusa na-asụ Bekee maliteere otu nwoke na-asụ Vietnamese na nwunye ya na-asụ Thai, ọmụmụ ihe. E jiri akwụkwọ na Bible Bekee, Vietnamese, na Thai wee mee ihe n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụ ezie na ihe mgbochi nke asụsụ wetara ihe ịma aka ná mmalite, onye nkwusa ahụ na-ede, sị: “Uto ime mmụọ nke di na nwunye ahụ adịwo oké ngwa. Ha ahụwo mkpa ọ dị ịmalite ịbịa nzukọ ha na ụmụ ha abụọ, ha na-agụkwa Bible kwa abalị dị ka ezinụlọ. Nwa ha nwanyị dị afọ isii na-eduzi ọmụmụ Bible nke ya.”

19 Mgbe ị na-amụrụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ ihe, jiri nwayọọ na-ekwu okwu, na-akpọpụta okwu n’ụzọ doro anya, ma jiri okwu na nkebi ahịrịokwu ndị dị mfe na-eme ihe. Otú ọ dị, buru n’uche na e kwesịrị imeso ndị na-asụ asụsụ ọzọ n’ụzọ nkwanye ùgwù. E kwesịghị imeso ha dị ka ha bụ ụmụ ọhụrụ.

20 Jiri ihe osise ndị mara mma dị na broshuọ Na-achọ mee ihe nke ọma. Ọ bụrụ na “otu foto ruru ka otu puku okwu,” ọtụtụ ihe osise dị na broshuọ ahụ ga-ezi onye ahụ nwe ụlọ ọtụtụ ihe. Kpọọ ya òkù ịgụpụta akwụkwọ nsọ ndị ahụ site na Bible nke ya. Ọ bụrụ na a pụrụ iduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe onye òtù ezinụlọ nke maara Bekee nọ ya ịtụgharị ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke ahụ ga-aba uru.—Lee Ozi Alaeze Anyị, July 1984, peji nke 8.

21 Mee Nletaghachi n’Egbughi Oge: Ogologo oge hà aṅaa ka ị ga-echeru tupu i mee nletaghachi? Ụfọdụ ndị nkwusa na-alaghachi n’otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ mgbe nzute mbụ gasịrị. Ndị ọzọ na-alaghachi n’otu ụbọchị ahụ! Ọ̀ dị ngwa ngwa gabiga ókè? N’ozuzu ya, ndị nwe ụlọ eyighị ka ọ na-ewute ha. Ọtụtụ mgbe ọ na-abụ onye nkwusa ahụ na-eme nleta ahụ ka ọ dị mkpa ịzụlite àgwà ziri ezi karị ya na ntakịrị obi ike. Tụlee ahụmahụ ndị na-esonụ.

22 Otu onye nkwusa dị afọ 13 nọ na-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ otu ụbọchị mgbe ọ hụrụ ụmụ nwanyị abụọ so na-aga. N’iburu n’uche agbamume nke imere ndị mmadụ nkwusa n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha, ọ gakwuuru ụmụ nwanyị ahụ n’okporo ámá. Ha gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ, onye nke ọ bụla natakwara akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nwanna nwoke ahụ na-eto eto natara adres ha, laghachi ka ụbọchị abụọ gasịrị, ma malitere nke ọ bụla n’ime ha ọmụmụ Bible.

23 Otu nwanna nwanyị na-eme ndokwa ịlaghachi n’izu na-esonụ. Ma otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ mgbe ọbịbịa mbụ gasịrị, ọ na-akwụsị na nke onye ahụ nwe ụlọ inye ya magazin n’isiokwu ahụ ha kwurịtaburu. Ọ na-agwa onye nwe ụlọ, sị: “Ahụrụ m isiokwu a wee chee na ị ga-enwe mmasị ịgụ ya. Apụghị m ịnọrọ ala ugbu a inwe nkwurịta okwu, ma m ga-alaghachi n’ehihie Wednesday dị ka anyị mere ndokwa ya. Oge ahụ ọ̀ ka ga-adịkwara gị mma?”

24 Mgbe mmadụ gosiri mmasị n’eziokwu ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enweta mmegide n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ. Anyị ịlaghachi ngwa ngwa mgbe nzute mbụ gasịrị ga-ewusi ya ike iguzogide nrụgide ọ bụla ọ na-enweta site n’aka ndị ikwu, ndị enyi chiri anya, na ndị ọzọ.

25 Zụlite Mmasị nke Ndị A Hụrụ n’Ebe Ọha Mmadụ Na-anọ: Ọtụtụ n’ime anyị na-enwe mmasị ime nkwusa n’okporo ámá, n’ebe bọs na-akwụsị, n’ụgbọ njem ọha na eze, n’ụlọ ahịa, n’ogige ntụrụndụ, na n’ebe ndị ọzọ. Tinyere itinye akwụkwọ, ọ dị anyị mkpa ịzụlite mmasị. Iji mee nke ahụ, e kwesịrị ime mgbalị inweta aha, adres, na ọ bụrụ na o kwe mee, nọmba telifon nke onye ọ bụla nwere mmasị anyị zutere. Inweta ihe ọmụma a esirughị ike otú ị pụrụ iche. Ka mkparịta ụka ahụ na-abịa ná njedebe ya, wepụta akwụkwọ ndetu ihe gị ma jụọ, sị: “Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla anyị pụrụ isi gaa n’ihu ná mkparịta ụka a n’oge ọzọ?” Ma ọ bụ kwuo, sị: “M ga-enwe mmasị ka ị gụọ otu isiokwu nke m ji n’aka na ọ ga-amasị gị. Ọ̀ bụ m weta ya n’ụlọ gị ka ọ̀ bụ n’ọfịs gị?” Nanị ihe otu nwanna nwoke na-ajụ bụ: “Olee nọmba a pụrụ iji nweta gị?” Ọ na-akọ na n’ọnwa atọ mmadụ nile ma e wezụga mmadụ atọ nwere obi ụtọ inye ya nọmba fon ha.

26 Jiri Telifon Chọta ma Zụlite Mmasị: Otu nwanna nwanyị bụ onye ọsụ ụzọ na-eji telifon erute ndị bi n’ụlọ ebe ndị a na-adịghị ekwe ndị ọbịa banye. Ọ na-emekwa nletaghachi n’otu ụzọ ahụ. N’ọbịbịa mbụ, ọ na-asị: “Amaara m na ị maghị onye m bụ. Ana m eme mgbalị pụrụ iche ịkpọtụrụ ndị mmadụ n’ógbè unu iji soro ha kerịta otu echiche sitere na Bible. Ọ bụrụ na i nwere ntakịrị oge, m ga-enwe mmasị ịgụrụ gị nkwa dị na . . .” Mgbe ọ gụsịrị akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ, ọ na-asị: “Ọ́ gaghị amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịhụ mgbe oge ahụ ruru? Ọ tọwo m ụtọ ịgụrụ gị nke a. Ọ bụrụ na ọ tọkwara gị ụtọ, m ga-enwe mmasị ịkpọ ọzọ ma tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ ọzọ.”

27 Mgbe ọ kpọghachiri na fon, ọ na-echetara onye nwe ụlọ banyere mkparịta ụka ha nweburu ma kwuo na ya ga-enwe mmasị ịgụpụta site n’ime Bible otú ọnọdụ ga-adị mgbe e wepụrụ ajọ omume. Mgbe ahụ ọ na-esoro onye nwe ụlọ nwee ntakịrị nkwurịta okwu Bible. N’oge ọtụtụ mkparịta ụka telifon, mmadụ 35 akpọwo ya òkù ịbịa n’ụlọ ha, a malitewokwa ọmụmụ Bible asaa! Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ijere ndị nwere mmasị nletaghachi n’oge udu mmiri n’ihi ụzọ ndị a na-apụghị isi na ha gafere ma ọ bụ ọrịa? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ma gị na ha na-ekwurịta okwu site na telifon?

28 Sochie Mmasị A Chọtara n’Ebe Achụmnta Ego: Ịrụ ọrụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa gụnyere nnọọ ihe karịrị nanị inyefe magazin. Ọtụtụ ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa nwere ezi mmasị n’eziokwu ahụ, a ghaghịkwa ịzụlite mmasị ahụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ikwe mee inwe nkwurịta okwu Bible ma ọ bụ ọbụna ọmụmụ ihe kpọmkwem n’ebe ahụ. N’ọnọdụ ndị ọzọ, gị na onye ahụ nwere mmasị pụrụ inwe ike ịnọkọ n’oge ezumike ehihie ma ọ bụ n’oge ọzọ dị mma.

29 Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kpọtụụrụ otu onye nwere ntakịrị ụlọ ahịa na-ere ihe ndị e ji esi nri ma kwuo ka ya gosi ya otú e si enwe ọmụmụ Bible. Mgbe ọ jụrụ ya oge hà aṅaa ihe ngosi ahụ ga-ewe, onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị kwuru na ọ ga-ewe nanị minit 15. Mgbe o kwuru nke ahụ, onye nwe ụlọ ahịa ahụ konyere otu ihe àmà n’ọnụ ụzọ: “Laghachite na Minit 20,” bupụta oche ole na ole, ha abụọ kwurịtakwara paragraf ise ndị mbụ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nwoke a nwere obi eziokwu nwere nnọọ mmasị n’ihe ọ mụtara nke na ọ gara Nzukọ Ihu Ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Sunday ahụ ma kweta ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ n’izu na-esonụ.

30 Iji malite ọmụmụ ihe n’ebe achụmnta ego, ị pụrụ ikwu nke a: “Ọ na-ewe nanị minit 15 iji gosi usoro ọmụmụ Bible anyị. Ọ bụrụ na ọ gaghị enye gị nsogbu, obi ga-adị m ụtọ igosi gị otú e si eme ya.” Mgbe ahụ, agafela oge e nyere. Ọ bụrụ na o kweghị omume inwe nkwurịta okwu dị ogologo n’ebe achụmnta ego, ọ pụrụ ikwesị ekwesị karị ịkpọtụrụ onye ahụ nwe ụlọ ahịa n’ebe obibi ya.

31 Laghachi Ọbụna Mgbe A Na-etinyeghị Akwụkwọ: Ntakịrị mmasị ọ bụla kwesịrị nletaghachi, ma e tinyere akwụkwọ ma e tinyeghị. N’ezie, ọ bụrụ na o doo anya na onye nwe ụlọ enweghị mmasị n’ezie n’ozi Alaeze ahụ, ọ kasị mma iche mgbalị gị ihu n’ebe ọzọ.

32 N’ọrụ ụlọ ruo n’ụlọ, otu nwanna nwanyị zutere otu nwaada nwere nnọọ omume enyi, onye jụwapụrụ isi ịnara magazin ndị e nyefere ya. Onye nkwusa ahụ na-ede, sị: “Ruo ọtụtụ ụbọchị echere m echiche banyere ya ma kpebie na m chọrọ ịgwa ya okwu ọzọ.” N’ikpeazụ, nwanna nwanyị ahụ kpere ekpere, nweta obi ike, ma kụọ aka n’ọnụ ụzọ nwaada ahụ. N’ụzọ nyere ya obi ụtọ, onye ahụ nwe ụlọ kpọbatara ya n’ime ụlọ. A malitere ọmụmụ Bible, e duzikwara ya ọzọ echi ya. Ka oge na-aga, onye ahụ nwe ụlọ batara n’eziokwu.

33 Mee Atụmatụ Tupu Oge Eruo Iji Rụzuo Ihe Kasị Ukwuu: A na-atụ aro ka e tinye oge ụfọdụ kwa izu n’ime nletaghachi. A pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu site n’ime ezi atụmatụ. Mee ndokwa ije nletaghachi ndị dị n’otu ógbè ahụ ị ga-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ.

34 Ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ime nletaghachi na n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi na-ekwu na ọ dị mkpa igosi ezi mmasị onwe onye n’ebe ndị mmadụ nọ ma nọgide na-eche banyere ha ọbụna mgbe e mesịrị nleta ahụ. Ọ dịkwa mkpa inwe isiokwu Bible na-adọrọ adọrọ a ga-atụle na ịtọ ntọala maka nletaghachi tupu a lawa n’ọbịbịa mbụ. Ọzọkwa, ọ dị mkpa ịlaghachi ozugbo iji sochie mmasị ahụ. A ghaghị iburu n’uche mgbe nile ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible.

35 Otu àgwà dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ ime nletaghachi bụ obi ike. Olee otú e si enweta ya? Pọl onyeozi na-aza site n’ikwu na anyị ‘na-enweta obi ike’ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ “site na Chineke anyị.” Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ito n’akụkụ a, kpegara Jehova ekpere maka enyemaka. Mgbe ahụ, n’ikwekọ n’ekpere gị, sochie mmasị nile. N’ezie Jehova ga-agọzi mgbalị gị!

Igbe dị na peeji nke 3]

Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ime Nletaghachi

■ Gosi ezi mmasị onwe onye n’ebe ndị mmadụ nọ.

■ Họrọ isiokwu Bible na-adọrọ adọrọ a ga-atụle.

■ Tọọ ntọala maka nleta ọ bụla ga-esochi.

■ Nọgide na-eche banyere onye ahụ mgbe ị lasịrị.

■ Laghachi n’otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ iji sochie mmasị ahụ.

■ Buru n’uche ebumnobi gị ịmalite ọmụmụ Bible.

■ Kpee ekpere maka enyemaka inweta obi ike maka ọrụ a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya