Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2000
Ntụziaka
N’ime afọ 2000, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu (Mbipụta nke 1998) [td-IB] ga-abụ ebe ndị a ga-esi na-enye ihe omume.
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata dị nkenke malite ụlọ akwụkwọ N’OGE. Ọ dịghị mkpa ikwu ihe ndị a ga-atụ anya ha n’usoro ihe omume ahụ. Ka onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-akpọlite ihe omume nke ọ bụla, ọ ga-ekwu isiokwu a ga-ekwu okwu na ya. Gaa n’ihu n’usoro a:
IHE OMUME NKE 1: minit 15. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche. E kwesịrị ime ihe omume a dị ka okwu izi ihe ga-ewe minit 15 n’enweghị ajụjụ ọnụ. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ kama ilekwasị anya n’abamuru nke ihe ọmụma ahụ a na-atụle, na-eme ka ihe ga-akasị nyere ọgbakọ aka pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe.
Ụmụnna e kenyere okwu a kwesịrị ilezi anya ka ha ghara ịgabiga oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha ma ọ dị mkpa ma ọ bụ ọ bụrụ na ọkà okwu ahụ ekwuo ka e nye ya.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: minit 6. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, bụ́ onye ga-atụle isiokwu ahụ n’ụzọ dị irè n’ikwekọ ná mkpa ọgbakọ. Ọ dịghị mkpa ka e nwee isiokwu. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ọgụgụ ahụ e kenyere ka a gụọ. A pụrụ ịgụnye ntụleghachi nke isiakwụkwọ Bible nile e kenyere bụ́ nke ga-ewe sekọnd 30 ruo 60. Otú ọ dị, nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere na ụzọ ihe ọmụma ahụ si baara anyị uru. Mgbe ahụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwa ndị mmụta ka ha gaa na klas ha dị iche iche.
IHE OMUME NKE 2: minit 5. Nke a bụ ọgụgụ Bible nke ebe e kenyere ka a gụọ, nke nwanna nwoke ga-agụ. Otú a ka ọ ga-adị n’ụlọ akwụkwọ nke mbụ na n’ìgwè ndị ọzọkwa. Ọgụgụ ihe ahụ na-adịkarị nkenke iji nye ndị mmụta ahụ ohere ikwu okwu nkọwa dị mkpirikpi ná mmalite na ná mmechi okwu ha. A pụrụ ịgụnye ihe ọmụma akụkọ ihe mere eme, nghọta nke okwu amụma ma ọ bụ ozizi, na ụzọ a pụrụ isi jiri ụkpụrụ dị iche iche mee ihe. E kwesịrị ịgụ amaokwu nile ahụ e kenyere n’akwụsịtụghị akwụsị. Otú ọ dị, mgbe amaokwu ndị a gaje ịgụ na-esochighị onwe ha, onye mmụta ahụ pụrụ ịkpọ amaokwu ebe ọgụgụ ihe ahụ gafere.
IHE OMUME NKE 3: minit 5. A ga-ekenye nwanna nwanyị nke a. Isiokwu nke okwu a ga-adabere n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu. Ọnọdụ okwu ahụ pụrụ ịbụ ịgba àmà mberede, nletaghachi, ma ọ bụ ọmụmụ Bible ebe obibi, ndị na-eme ya pụkwara ịnọdụ ala ma ọ bụ iguzo ọtọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta ahụ si kọwaa isiokwu ahụ e kenyere ya ma nyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche. Onye mmụta e kenyere ihe omume a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye otu onye inyeaka, ma a pụrụ ijikwu onye inyeaka ọzọ mee ihe. Ọ bụghị ọnọdụ okwu ahụ kama ụzọ e si jiri Bible mee ihe n’ụzọ dị irè bụ ihe e kwesịrị ichebara echiche karịsịa.
IHE OMUME NKE 4: minit 5. Isiokwu nke ihe omume a ga-adabere n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe, onye mmụta ahụ kwesịkwara ịgbalị iji akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche mee ihe n’ụzo dị irè. A pụrụ ikenye nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị Ihe Omume nke 4. Mgbe ọ bụla e kenyere ya nwanna nwoke, o kwesịrị ịbụ okwu. Mgbe e kenyere ya nwanna nwanyị, e kwesịrị ime ya dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3. Ọzọkwa, mgbe ọ bụla e nwere akara # tupu isiokwu maka Ihe Omume nke 4, ọ kasị mma ka e kenye ya nwanna nwoke.
*USORO ỌGỤGỤ BIBLE NTỤKWASỊ: E tinyere nke a n’ime akara ngebichi na-eso nọmba abụ a ga-eji mee ihe maka izu ọ bụla. Site n’ịgbaso usoro a, na-agụ ihe dị ka peji iri n’otu izu, a pụrụ ịgụcha Bible dum n’afọ atọ. Ọ dịghị akụkụ dị n’usoro ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ntụleghachi odide nke dabeere n’usoro ihe ọgụgụ ntụkwasị ahụ.
RỊBA AMA: Iji nwetakwuo ihe ọmụma na ntụziaka banyere ndụmọdụ, idebe oge, ntụleghachi odide, na ịkwadebe ihe omume, biko lee peji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996.
USORO IHE OMUME
Jan. 3 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 4-6
Abụ nke 9 [*Jeremaịa 49-52]
Nke 1: Nwee Ekele Maka Ngọzi Jehova (w98 1/1 p. 22-24)
Nke 2: Deuterọnọmi 6:4-19
Nke 3: td 15A Ihe Mere Chineke Na-ejighị Akwado Ife Ndị Nna Ochie Ofufe
Nke 4: td 15B A Pụrụ Ịsọpụrụ Ndị Mmadụ, ma Nanị Chineke Ka A Ga-efe
Jan. 10 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 7-10
Abụ nke 49 [*Abụ Ákwá 1-5]
Nke 1: Bulie Ezi Chineke ahụ Elu (w98 1/1 p. 30-31)
Nke 2: Deuterọnọmi 8:1-18
Nke 3: td-IB 4A Amagedọn—Agha Ga-akwụsị Ajọ Omume
Nke 4: td-IB 4B Ihe Mere Amagedọn Ji Bụrụ Omume Ịhụnanya Chineke Mere
Jan. 17 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 11-14
Abụ nke 132 [*Ezikiel 1-9]
Nke 1: Ihe Mere Anyị Ga-eji Buru Ụzọ Mee Atụmatụ Maka Ndị Anyị Hụrụ n’Anya (w98 1/15 p. 19-22)
Nke 2: Deuterọnọmi 11:1-12
Nke 3: td 6A Baptism—Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Kraịst
Nke 4: td 6B Baptism Adịghị Asachapụ Mmehie
Jan. 24 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 15-19
Abụ nke 162 [*Ezikiel 10-16]
Nke 1: Ike Eziokwu Nwere Inwogha na Ijikọta Ndị Mmadụ (w98 1/15 p. 29-31)
Nke 2: Deuterọnọmi 19:11-21
Nke 3: td 7A Bible Bụ Okwu Chineke nke Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ
Nke 4: td 7B Bible—Ihe Nduzi Bara Uru Maka Ụbọchị Anyị
Jan. 31 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 20-23
Abụ nke 13 [*Ezikiel 17-21]
Nke 1: Echiche Akwụkwọ Nsọ Banyere Otuto na Okwu Ire Ụtọ (w98 2/1 p. 29-31)
Nke 2: Deuterọnọmi 20:10-20
Nke 3: td 7CH Bible—Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
Nke 4: td 38A Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara
Feb. 7 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 24-27
Abụ nke 222 [*Ezikiel 22-27]
Nke 1: Ihe Ndabere Maka Inwe Ezi Nchekwube (w98 2/1 p. 4-6)
Nke 2: Deuterọnọmi 25:5-16
Nke 3: td-IB 38B È Kwesịrị Ichebe Ndụ Mmadụ n’Agbanyeghị Ihe Ọ Ga-ewe?
Nke 4: td-IB 40A Olee Mgbe Oge Ndị Jentaịl Gwụrụ?
Feb. 14 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 28-30
Abụ nke 180 [*Ezikiel 28-33]
Nke 1: Zụlite Mmụọ nke Inwe Ekele (w98 2/15 p. 4-7)
Nke 2: Deuterọnọmi 28:1-14
Nke 3: td 8A Gịnị Bụ Chọọchị Ndị Kraịst?
Nke 4: td 8B Ọ̀ Bụ Pita Bụ “Nkume” Ahụ?
Feb. 21 Ọgụgụ Bible: Deuterọnọmi 31-34
Abụ nke 46 [*Ezikiel 34-39]
Nke 1: w84 8/15 p. 28 para. 7 ruo p. 30 para. 8
Nke 2: Deuterọnọmi 32:35-43
Nke 3: td 35A Sayensị A Nwapụtara Anwapụta Na-akwado Ihe Ndekọ Bible Banyere Okike
Nke 4: td 35B Ụbọchị Okike nke Ọ Bụla Ọ̀ Bụ Oge Dị Awa 24?
Feb. 28 Ọgụgụ Bible: Joshua 1-5
Abụ nke 40 [*Ezikiel 40-45]
Nke 1: w84 9/15 p. 26 para. 1 ruo p. 27 para. 3
Nke 2: Joshua 2:8-16
Nke 3: td 34A Jisọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?
Nke 4: td 34B Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ife Obe?
Mar. 6 Ọgụgụ Bible: Joshua 6-9
Abụ nke 164 [*Ezikiel 46–Daniel 2]
Nke 1: Ndị Nne na Nna—Chebenụ Ụmụ Unu! (w98 2/15 p. 8-11)
Nke 2: Joshua 7:1, 10-19
Nke 3: td 41A Gịnị Wetara Ọnwụ?
Nke 4: td 41B Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Imerụ Gị Ahụ?
Mar. 13 Ọgụgụ Bible: Joshua 10-13
Abụ nke 138 [*Daniel 3-7]
Nke 1: Ihe Bible Na-ekwu Banyere Ikike Ndọrọ (w98 2/15 p. 23-27)
Nke 2: Joshua 11:6-15
Nke 3: td 41CH Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Iso Ndị Ikwu Ha Nwụrụ Anwụ Kwurịta Okwu?
Nke 4: td 10A Ekwensu Ọ̀ Bụ Onye Dị Adị n’Ezie?
Mar. 20 Ọgụgụ Bible: Joshua 14-17
Abụ nke 10 [*Daniel 8–Hosea 2]
Nke 1: Ndị Ikom Kwesịrị Ntụkwasị Obi Bụ́ Ndị “Yiri Anyị n’Ahụ” Ha (w98 3/1 p. 26-29)
Nke 2: Joshua 15:1-12
Nke 3: td 10B Ekwensu—Onye A Na-adịghị Ahụ Anya nke Na-achị Ụwa
Nke 4: td 10CH Ihe Bible Na-ekwu Banyere Ndị Mmụọ Ozi Mehierenụ
Mar. 27 Ọgụgụ Bible: Joshua 18-20
Abụ nke 105 [*Hosea 3-14]
Nke 1: Icheta Ụbọchị Ndị Ikpeazụ nke Jisọs n’Ụwa (w98 3/15 p. 3-9)
Nke 2: Joshua 18:1-10
Nke 3: td 44A Ụwa—E Kere Ya Ka Ọ Bụrụ Paradaịs
Nke 4: td 44B Ndụ A Dị n’Ụwa Agaghị Akwụsị Akwụsị
Apr. 3 Ọgụgụ Bible: Joshua 21-24
Nke 1: w84 9/15 p. 28 para. 1 ruo p. 30 para. 1
Nke 2: Joshua 21:43–22:8
Nke 3: td 29A Ị̀ Pụrụ Ịmata Ndị Amụma Ụgha?
Nke 4: td 19A Olee Otú Ọgwụgwọ Ime Mmụọ Dịruru ná Mkpa?
Apr. 10 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 1-4
Nke 1: w84 10/15 p. 27 para. 1 ruo p. 28 para. 1
Nke 2: Ndị Ikpe 3:1-11
Nke 3: td 19B Alaeze Chineke—Ụzọ Isi Weta Ngwọta Anụ Ahụ Na-adịgide Adịgide
Nke 4: td 19CH Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa nke Oge A Esiteghị n’Aka Chineke
Apr. 17 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 5-7
Abụ nke 193 [*Maịka 6–Zefanaịa 1]
Nke 1: Mụta Ihe Site ná Ntụziaka Ndị Jisọs Nyere Mmadụ 70 Ahụ (w98 3/1 p. 30-31)
Nke 2: Ndị Ikpe 5:24-31
Nke 3: td 19D Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Ọ̀ Bụ Ihe Àmà E Ji n’Aka nke Ihu Ọma Chineke?
Nke 4: td 11A Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?
Apr. 24 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Deuterọnọmi 4–Ndị Ikpe 7
Abụ nke 91 [*Zefanaịa 2–Zekaraịa 7]
May 1 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 8-10
Abụ nke 38 [*Zekaraịa 8–Malakaị 4]
Nke 1: Sọpụrụ Ùgwù nke Ndị Ọzọ (w98 4/1 p. 28-31)
Nke 2: Ndị Ikpe 9:7-21
Nke 3: td 13A Hel Abụghị Ebe Ịta Ahụhụ
Nke 4: td 13B Ọkụ Bụ Ihe Atụ nke Mbibi
May 8 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 11-14
Abụ nke 82 [*Matiu 1-8]
Nke 1: Banabas, “Nwa nke Nkasị Obi” (w98 4/15 p. 20-23)
Nke 2: Ndị Ikpe 13:2-10, 24
Nke 3: td 13CH Akụkọ Ọgaranya na Lazarọs Adịghị Akwado Ịta Ahụhụ Ebighị Ebi
Nke 4: td 42A Otú Ndị Kraịst Si Ele Ememe Anya
May 15 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 15-18
Abụ nke 26 [*Matiu 9-14]
Nke 1: Ịnọ ná Ntụkwasị Obi nke Ụwa n’Enweghị Usuu Ndị Agha (w98 4/15 p. 28-30)
Nke 2: Ndị Ikpe 17:1-13
Nke 3: td 17A Iji Ihe Oyiyi Eme Ihe Adịghị Enye Chineke Nsọpụrụ
Nke 4: td-IB 17B Ihe Ndị Na-esi n’Ife Ihe Oyiyi Ofufe Apụta
May 22 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 19-21
Abụ nke 42 [*Matiu 15-21]
Nke 1: w84 10/15 p. 28 para. 2 ruo p. 30 para. 6
Nke 2: Ndị Ikpe 19:11-21
Nke 3: td 17CH Nanị Jehova Ka A Ga-efe Ofufe
Nke 4: td 31A #Ụzọ Ngwakọ Okwukwe Abụghị Ụzọ nke Chineke
May 29 Ọgụgụ Bible: Rut 1-4
Abụ nke 120 [*Matiu 22-26]
Nke 1: w93 8/15 p. 27 para. 5 ruo p. 28 para. 3
Nke 2: Rut 3:1-13
Nke 3: td 31B Okpukpe Nile Hà Dịcha Mma?
Nke 4: td-IB 20A Ndị Kraịst Kwesịrị Iji Aha Chineke Na-eme Ihe
June 5 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 1-3
Nke 1: w85 1/15 p. 22 para. 1-5
Nke 2: 1 Samuel 1:9-20
Nke 3: td 20B Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Ịdị Adị Chineke
Nke 4: td-IB 20CH #Ịmata Àgwà Chineke
June 12 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 4-7
Abụ nke 85 [*Mak 5-9]
Nke 1: Ònye Bụ Jehova? (w98 5/1 p. 5-7)
Nke 2: 1 Samuel 4:9-18
Nke 3: td 20D Ọ Bụghị Mmadụ Nile Na-ejere Otu Chineke ahụ Ozi
Nke 4: td-IB 28A Ndịàmà Jehova Hà Bụ Okpukpe Ọhụrụ?
June 19 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 8-11
Abụ nke 160 [*Mak 10-14]
Nke 1: E Nyere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Ụgwọ Ọrụ (w98 5/1 p. 30-31)
Nke 2: 1 Samuel 8:4-20
Nke 3: td 21A Jisọs Kraịst—Ọkpara Chineke na Eze Ọ Họpụtara
Nke 4: td 21B Ihe Mere Ikwere na Jisọs Ji Dị Oké Mkpa Maka Nzọpụta
June 26 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 12-14
Nke 1: Akụ̀ na Ụba Ọ̀ Pụrụ Ime Gị Obi Ụtọ? (w98 5/15 p. 4-6)
Nke 2: 1 Samuel 14:1-14
Nke 3: td 21CH Nanị Ikwere na Jisọs Ò Zuru Iji Bụrụ Onye A Ga-azọpụta?
Nke 4: td 2A #Ngọzi Ndị Alaeze Chineke Ga-eweta
July 3 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 15-17
Abụ nke 8 [*Luk 4-8]
Nke 1: Yunaịsị na Lọịs—Ndị Nkụzi Bụ́ Ezi Ihe Nlereanya (w98-IB 5/15 p. 7-9)
Nke 2: 1 Samuel 16:4-13
Nke 3: td-IB 2B Ịchịisi Alaeze Ga-amalite Mgbe Ndị Iro Kraịst Ka Nọ n’Ọrụ
Nke 4: td-IB 2CH Alaeze Chineke Agaghị Abịa Site ná Mgbalị Mmadụ
July 10 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 18-20
Abụ nke 156 [*Luk 9-12]
Nke 1: Jiri Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-eru n’Obi (w98 5/15 p. 21-23)
Nke 2: 1 Samuel 19:1-13
Nke 3: td 23A Ihe “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara
Nke 4: td 23B #Mụrụ Anya n’Ime Mmụọ Maka Ihe Àmà Na-egosi Mgbe Ikpeazụ
July 17 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 21-24
Abụ nke 33 [*Luk 13-19]
Nke 1: Buru Ibu Ọru Ezinụlọ Gị (w98 6/1 p. 20-23)
Nke 2: 1 Samuel 24:2-15
Nke 3: td 30A Ndụ Ebighị Ebi Abụghị Nanị Nrọ
Nke 4: td 30B Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?
July 24 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 25-27
Abụ nke 60 [*Luk 20-24]
Nke 1: Ezi Ikpe—Olee Mgbe, n’Ụzọ Dịkwa Aṅaa? (w98 6/15 p. 26-29)
Nke 2: 1 Samuel 25:23-33
Nke 3: td 30CH A Kpaghị Ókè n’Ọnụ Ọgụgụ Ndị Ga-enweta Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa
Nke 4: td 3A #Njikọ Alụmdi na Nwunye Aghaghị Ịbụ Ihe A Na-asọpụrụ
July 31 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 28-31
Abụ nke 170 [*Jọn 1-6]
Nke 1: w85 1/15 p. 23 para. 1 ruo p. 24 para. 3
Nke 2: 1 Samuel 31:1-13
Nke 3: td 3B Ndị Kraịst Aghaghị Ịsọpụrụ Ụkpụrụ Ịbụisi
Nke 4: td 3CH Ọrụ Nne na Nna Nwere n’Ebe Ụmụ Ha Nọ
Aug. 7 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 1-4
Abụ nke 22 [*Jọn 7-11]
Nke 1: w85 1/15 p. 24 para. 4 ruo p. 25 para. 5
Nke 2: 2 Samuel 2:1-11
Nke 3: td 3D Ndị Kraịst Kwesịrị Ịlụ Nanị Ndị Kraịst
Nke 4: td 3E Ezi Ndị Kraịst Adịghị Alụ Karịa Otu Nwanyị
Aug. 14 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 5-8
Abụ nke 174 [*Jọn 12-18]
Nke 1: “Jisienụ Ike” (w98 6/15 p. 30-31)
Nke 2: 2 Samuel 7:4-16
Nke 3: td 14A Meri Bụ Nne Jisọs, Ọ Bụghị “Nne nke Chukwu”
Nke 4: td 14B Bible Na-egosi na Meri ‘Anọgideghị n’Amaghị Nwoke’
Aug. 21 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 9-12
Nke 1: Bụrụ Ezi Onye Agbata Obi (w98 7/1 p. 30-31)
Nke 2: 2 Samuel 11:2-15
Nke 3: td 12A Ihe Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere Ememe Ncheta
Nke 4: td 12B Ido Mas Esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ
Aug. 28 Ntụleghachi Odide. Gụzuo Ndị Ikpe 8–2 Samuel 12
Abụ nke 177 [*Ọrụ 5-10]
Sept. 4 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 13-15
Abụ nke 183 [*Ọrụ 11-16]
Nke 1: Mee Ka Ụmụ Gị Nwee Ezi Mmalite ná Ndụ (w98 7/15 p. 4-6)
Nke 2: 2 Samuel 13:20-33
Nke 3: td 37A Ndị Kraịst Nile Aghaghị Ịbụ Ndị Ozi
Nke 4: td 37B Iru Eru A Chọrọ Maka Ozi Ahụ
Sept. 11 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 16-18
Abụ nke 129 [*Ọrụ 17-22]
Nke 1: Otú Ndị Kraịst Si Ele Omenala Olili Ozu Anya (w98 7/15 p. 20-24)
Nke 2: 2 Samuel 16:5-14
Nke 3: td 25A Ihe Mere E Ji Kpọọ Ezi Ndị Kraịst Asị
Nke 4: td 25B Nwunye Ekwesịghị Ikwe Ka Di Ya Kewapụ Ya n’Ebe Chineke Nọ
Sept. 18 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 19-21
Abụ nke 19 [*Ọrụ 23–Ndị Rom 1]
Nke 1: Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Akọ na Uche Gị Obi? (w98 9/1 p. 4-7)
Nke 2: 2 Samuel 20:1, 2, 14-22
Nke 3: td 25CH Di Ekwesịghị Ikwe Ka Nwunye Ya Gbochie Ya Ijere Chineke Ozi
Nke 4: td 9A Ekpere Ndị Chineke Na-anụ
Sept. 25 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 22-24
Abụ nke 98 [*Ndị Rom 2-9]
Nke 1: Ihe Mmụta Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ na nke Abụọ (w85 1/15 p. 22-25)
Nke 2: 2 Samuel 23:8-17
Nke 3: td 9B Ihe Mere na Ekpere Ụfọdụ Ezighị Ezi
Nke 4: td 39A A Kaghị Ọdịnihu Mmadu Aka
Oct. 2 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 1-2
Abụ nke 36 [*Ndị Rom 10–1 Ndị Kọrint 3]
Nke 1: w85 6/1 p. 27 para. 1 ruo p. 28 para. 2
Nke 2: 1 Ndị Eze 2:1-11
Nke 3: td 16A Ndụ Mmadụ nke Jisọs Bụ Ihe Mgbapụta Maka Mmadụ Nile
Nke 4: td 16B Ihe Mere Jisọs Ji Nwee Ike Ịkwụ Ihe Mgbapụta Ahụ
Oct. 9 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 3-6
Abụ nke 106 [*1 Ndị Kọrint 4-13]
Nke 1: Bute Ihe Ndị Mbụ Ụzọ (w98 9/1 p. 19-21)
Nke 2: 1 Ndị Eze 4:21-34
Nke 3: td 36A Ụzọ Isi Mata Otu Ezi Okpukpe Ahụ
Nke 4: td 36B Ọ̀ Dị Njọ Ịkatọ Ozizi Ụgha?
Oct. 16 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 7-8
Abụ nke 76 [*1 Ndị Kọrint 14–2 Ndị Kọrint 7]
Nke 1: Ịgba Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu (w98 9/1 p. 30-31)
Nke 2: 1 Ndị Eze 7:1-14
Nke 3: td 36CH Mgbe Chineke Na-akwado Mgbanwe Okpukpe
Nke 4: td 36D Chineke Ọ̀ Na-ahụ ‘Ihe Ọma n’Okpukpe Nile’?
Oct. 23 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 9-11
Abụ nke 97 [*2 Ndị Kọrint 8–Ndị Galetia 4]
Nke 1: Otú Ndị Kraịst Si Ele Ụgwọ Isi Nwanyị Anya (w98 9/15 p. 24-27)
Nke 2: 1 Ndị Eze 11:1-13
Nke 3: td 22A Ole Ndị Ka A Ga-esi n’Ọnwụ Kpọlite?
Nke 4: td 22B Olee Ebe A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ?
Oct. 30 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 12-14
Abụ nke 113 [*Ndị Galetia 5–Ndị Filipaị 2]
Nke 1: Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Ezie Nye Gị? (w98 9/15 p. 21-23)
Nke 2: 1 Ndị Eze 13:1-10
Nke 3: td 32A Nlọghachi Kraịst Bụ nke Anya Na-agaghị Ahụ
Nke 4: td 32B A Na-amata Nlọghachi Kraịst Site n’Ihe Ndị Na-eme Eme A Na-ahụ Anya
Nov. 6 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 15-17
Abụ nke 123 [*Ndị Filipaị 3–1 Ndị Tesalọnaịka 5]
Nke 1: Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ! (w98 10/1 p. 28-31)
Nke 2: 1 Ndị Eze 15:9-24
Nke 3: td 43A Iwu Ejighị Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike
Nke 4: td 43B E Nyeghị Ndị Kraịst Iwu Idebe Ụbọchị Izu Ike
Nov. 13 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 18-20
Abụ nke 159 [*2 Ndị Tesalọnaịka 1–2 Timoti 3]
Nke 1: Dozie Nsogbu n’Udo (w98-IB 11/1 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ndị Eze 20:1, 13-22
Nke 3: td 43CH Mgbe Ụbọchị Izu Ike Chineke Malitere na Mgbe Ọ Ga-akwụsị
Nke 4: td 33A Chineke Na-enye Nzọpụta Nanị Site n’Aka Kraịst
Nov. 20 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 21-22
Abụ nke 179 [*2 Timoti 4–Ndị Hibru 7]
Nke 1: w85 6/1 p. 28 para. 3 ruo p. 29 para. 5
Nke 2: 1 Ndị Eze 22:29-40
Nke 3: td 33B “A Zọpụtahaala, A Zọpụtasịwo” Esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ
Nke 4: td 33CH “Nzọpụta Ụwa Nile” Esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ
Nov. 27 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 1-3
Abụ nke 148 [*Ndị Hibru 8–Jemes 2]
Nke 1: w85 6/1 p. 29 para. 6 ruo p. 30 para. 2
Nke 2: 2 Ndị Eze 2:15-25
Nke 3: td 26A Ihe Mmehie Bụ
Nke 4: td 26B Ihe Mere Mmadụ Nile Ji Na-ata Ahụhụ Site ná Mmehie Adam
Dec. 4 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 4-6
Abụ nke 109 [*Jemes 3–2 Pita 3]
Nke 1: Kpachara Anya Maka Iji Ego Azụrụ Ọkwá (w98 11/15 p. 28)
Nke 2: 2 Ndị Eze 5:20-27
Nke 3: td 26CH Gịnị Bụ Mkpụrụ Osisi ahụ A Machibidoro Iwu?
Nke 4: td 26D Gịnị Bụ Mmehie Megide Mmụọ Nsọ?
Dec. 11 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 7-9
Abụ nke 117 [*1 Jọn 1–Mkpughe 1]
Nke 1: Ụkpụru Bible Ndị A Ga-agbaso Mgbe A Na-ebinye ma Ọ Bụ Na-ebiri Ego (w98 11/15 p. 24-27)
Nke 2: 2 Ndị Eze 7:1, 2, 6, 7, 16-20
Nke 3: td 24A Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?
Nke 4: td 24B Olee Ihe Dị Iche n’Etiti Mkpụrụ Obi na Mmụọ?
Dec. 18 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 10-12
Abụ nke 181 [*Mkpughe 2-12]
Nke 1: Akụkọ nke Bụ́ Ezie Banyere Ọmụmụ Jisọs (w98 12/15 p. 5-9)
Nke 2: 2 Ndị Eze 11:1-3, 9-16
Nke 3: td27A Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?
Nke 4: td 27B A Na-akpọ Ike Ndụ Ụmụ Mmadụ na nke Ụmụ Anụmanụ Mmụọ
Dec. 25 Ntụleghachi Odide. Gụzuo 2 Samuel 13–2 Ndị Eze 12
Abụ nke 217 [*Mkpughe 13-22]