Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2001
1 E nwere ọtụtụ ihe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere anyị nile kwesịrị iji kere òkè zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.—Ilu 15:23; Mat. 28:19, 20; Ọrụ 15:32; 1 Tim. 4:12, 13; 2 Tim. 2:2; 1 Pita 3:15.
2 Usoro ihe omume maka ọgụgụ Bible kwa izu bụ akụkụ dịteworo aka n’ụlọ akwụkwọ a. Ọ pụtara ịdị na-agụ ihe dị ka otu peeji nke Bible kwa ụbọchị. Malite n’afọ a, a na-ekenyekwa ọgụgụ Bible maka izu ntụleghachi odide ọ bụla. A gụzuola usoro ọgụgụ Bible ntụkwasị, bụ́ nke a gbakwụnyere kemgbe afọ atọ ugbu a. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu Bible karịa otú a haziri, ị pụrụ idepụta usoro ọgụgụ Bible nke gị.
3 Ihe Omume nke 2 na-azụ ụmụnna nwoke maka ‘ịgụ Okwu Chineke n’ihu ọha.’ (1 Tim. 4:13) Mgbe e kenyere gị ihe omume ịgụ ihe, gụgharịa ya ugboro ugboro n’olu dara ụda. Ị pụrụ iji kaseti a na-ege ege nke Society nke a gụnyere Bible n’ime ya mee ihe iji meziwanye otú i si akpọ okwu, mgbanwe ụda olu gị, na akụkụ ndị ọzọ nke ịgụ ihe nke ọma.
4 Ihe omume nke 3 na nke 4 dabeere n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu ma ọ bụ n’akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ. Ọ bụrụ na ebe ihe omume ahụ sitere karịrị ihe ị pụrụ ịtụlezu n’ime oge e nyere, họrọ nanị ihe ga-akasị baa uru maka ókèala ọgbakọ unu. A pụrụ iji ọnọdụ okwu ọ bụla kwesịrị ekwesị maka ókèala unu mee ihe.
5 Tinye mgbalị zuru ezu ezi uche dị na ya iji mee ihe omume nile e kenyere gị n’ụlọ akwụkwọ a. Wepụta oge kwadebe nke ọma, kwuokwa okwu site n’obi gị. Ị ga-abụ isi iyi nke agbamume nye ọgbakọ, gị onwe gị ga-eritekwa uru site n’iji obi gị nile na-ekere ókè n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’afọ 2001.