Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka Afọ 2002
1 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ adịghị eji ikike ikwu okwu akpọrọ oké ihe. Otú ọ dị, okwu ọnụ bụ onyinye sitere n’aka Jehova. Ọ na-eme ka anyị nwee ike isoro ndị ọzọ kwurịta okwu nakwa ikwupụta echiche na mmetụta anyị. Nke kasị mkpa, anyị pụrụ iji ya too Chineke anyị.—Ọma 22:22; 1 Kọr. 1:4-7.
2 A na-azụ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke iji kpọsaa aha Jehova. (Ọma 148:12, 13) Usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ maka afọ 2002 na-agụnye ọtụtụ isiokwu Bible ndị pụrụ ịbara anyị uru n’onwe anyị, ndị anyị pụkwara iji mee ihe n’ozi. Site n’ịkwadebe maka ụlọ akwụkwọ ahụ na ikere òkè na ya, anyị pụrụ ịmụba ihe ọmụma na nkà anyị dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke.—Ọma 45:1.
3 Na-agụ Bible Kwa Ụbọchị: Ọ bụrụ na anyị na-edebekarị Bible nso, anyị pụrụ iji ohere ọ bụla anyị nwere mee ihe iji gụọ ya. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-enwe minit ole na ole n’ụbọchị bụ́ ndị anyị pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dị otú a. Lee ka o si baa uru ịgụ ma ọ dịkarịa ala otu peeji kwa ụbọchị, nke bụ́ nanị ihe ọ na-ewe iji na-agbaso usoro ọgụgụ Bible e setịpụrụ n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ ahụ!—Ọma 1:1-3.
4 Ikike ịgụ Bible nke ọma pụrụ inyere anyị nnọọ aka iru n’obi ndị na-ege anyị ntị ma kpalie ha ito Jehova. Ụmụnna e kenyere ihe omume nke 2 n’ụlọ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịmụgharị nnọọ ịgụ ihe omume ahụ n’olu dara ụda. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-aja ha mma ma tụọ aro ndị ga-eme ka ọgụgụ ihe ahụ ka mma.
5 Jiri Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ Mee Ihe: Ihe omume nke 3 dabeere n’Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi ebe nke 4 dabeere n’Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ma eleghị anya ihe ka ọtụtụ n’ime anyị pụrụ ịgbalịsi ike ịdị na-eji ihe enyemaka a bara uru eme ihe mgbe mgbe n’ozi ubi. Ụmụnna nwanyị kwesịrị ịhọrọ ọnọdụ okwu ndị kwekọrọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ókèala ha. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwesịrị ilekwasị anya karịsịa n’otú ha si ezi ihe nakwa otú ha si eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe.
6 Ka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nyere anyị nile aka ịnọgide na-eji onyinye ikwu okwu nke Chineke nyere anyị na-akpọsa ozi ọma ahụ ma na-enye Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova, otuto!—Ọma 34:1; Efe. 6:19.