Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/10 p. 2
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gee Ntị n’Okwu Nsọ
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Na-ebinụ Obi n’Ụzọ Kwesịrị Ozi Ọma Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 1/10 p. 2

Igbe Ajụjụ

◼ Olee otú onye ọ bụla ga-esi nye aka mee ka ebe niile dị jụụ n’oge ọmụmụ ihe ọgbakọ? (Diut. 31:12)

Iji gosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù nke ukwuu nakwa na anyị ji ọmụmụ ihe anyị kpọrọ ihe, a na-agba anyị niile ume ka anyị na-abịa n’ezi oge ma dị njikere ịmụta ihe Jehova ga-akụziri anyị. Ọ kacha mma ịnọ n’oche ndị dị n’ihu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma hapụrụ ndị ji ụmụaka, na ndị na-abịa n’azụ oge mgbe ụfọdụ, oche ndị dị n’azụ. Tupu ọmụmụ ihe ebido, onye ọ bụla kwesịrị ịgbanyụ ihe ọ bụla nwere ike ime mkpọtụ ma ọ bụ gbanye ekwe ntị ya otú ọ na-agaghị eme mkpọtụ ma dọpụ uche ndị na-ege ntị. Ọ bụrụ na ndị niile bịara ọmụmụ ihe eburu n’uche na ọ bụ ife Jehova ka anyị bịara, a gaghị enwekebe ihe ndọpụ uche.—Ekli. 5:1; Fil. 2:4.

Mgbe ndị ọhụrụ malitere ịbịa ọmụmụ ihe, otu onye nkwusa maara ha nwere ike ịga n’oche ebe ha nọ ma nọnyere ha. Ndị nke a ga-aka abara uru bụ ndị nwere obere ụmụaka a ga-enye aka elekọta. O nwere ike ịbụ na ịnọ n’ọmụmụ ihe amabeghị ezinụlọ ahụ ahụ́. Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịkara ha mma ịnọ n’azụ ebe ha na-agaghị adọpụ ndị ọzọ uche ma nne ha ma ọ bụ nna ha chọọ ịkpọpụ ụmụ ha èzí mgbe ọ dị mkpa. (Ilu 22:6, 15) Ndị nwere obere ụmụaka ekwesịghị ịkpọrọ ha gaa nọrọ n’ebe ụmụaka ha ga-enwere onwe ha ime mkpọtụ. Ọ kacha mma ka ndị nne na nna kpọpụ ụmụ ha èzí ma ha chọọ ịbara ha mba ma ọ bụ imere ha ihe ndị ọzọ dị mkpa ma kpọbatakwa ha ozugbo.

Ọ bụ ọrụ ndị atendantị ịhụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị jụụ n’oge a na-amụ ihe. Ha na-enyere ezinụlọ dị iche iche aka ịchọta oche nakwa ịchọtara ndị na-abịaghị n’oge oche. Ndị atendantị na-egosi na ha dị akọ ma nwee ezi uche mgbe ha na-achọtara ndị ọzọ oche, ha na-ahụkwa na ha adọpụghị ndị ọzọ uche. E nwee ndị na-eme mkpọtụ, ha na-eji akọ agwa ha kwụsị ime mkpọtụ. Ọ bụrụ na e nwere nwatakịrị na-enye nsogbu, ndị atendantị nwere ike inye aka.

Ndị niile bịara ọmụmụ ihe nwere ike inye aka hụ na ebe niile dị jụụ mgbe a na-amụ banyere Jehova na nzube ya, nke bụ́ iweta ụwa ọhụrụ nke udo na ezi omume.—Hib. 10:24, 25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya