Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb20 Disemba p. 8
  • Akwụsịla Ịna-enye Ndị Mmadụ Magazin

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụsịla Ịna-enye Ndị Mmadụ Magazin
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Họrọ Isiokwu Dị Iche Iche Iji Nweta Mmasị Pụrụ Iche nke Ndị Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
mwb20 Disemba p. 8
Ebe otu nwanna nwaanyị ji otu isiokwu dị na ‘Teta!’ na-ezi otu nwaanyị ozi ọma

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Akwụsịla Ịna-enye Ndị Mmadụ Magazin

Kemgbe afọ 2018, Ụlọ Nche ọhaneze na Teta! anyị nke ọ bụla na-ekwu gbasara otu isiokwu. Magazin anyị ndị a so n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. N’ihi ya, anyị nwere ike ịna-enye ha ndị mmadụ n’ozi ọma. Anyị mewe njem ma ọ bụkwanụ na-aga ahịa, anyị nwere ike iwere ụfọdụ n’ime ha anyị nwere ike inye ndị mmadụ. Anyị anaghị eji magazin ndị a eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl, kama a haziri ha ka ha mee ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụ Baịbụl.

I ziwe mmadụ ozi ọma, gụọrọ ya otu amaokwu Baịbụl ma gwa ya otu isiokwu gbara na magazin anyị nwere ike ịmasị ya. Dị ka ihe atụ, onye ị na-ezi ozi ọma ò nwere ụmụaka, mmadụ ọ̀ nwụnahụrụ ya, ka ò nwere ihe na-echegbu ya? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịgwa ya, sị: “O nwere isiokwu mara mma m gụrụ kwuru gbasara ya. Ka m gosi gị ya.” Ị chọpụta na o nwere mmasị, i nwere ike inye ya magazin ahụ ma ọ bụkwanụ gị esi n’ekwentị ma ọ bụ ihe yiri ya zigara ya ya. I nwedịrị ike iziga ya n’oge mbụ i ziri ya ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na ihe kacha anyị mkpa abụghị inye ndị mmadụ magazin ndị a, ma ọ na-enyere anyị aka ịchọta ndị dị njikere ime ihe ndị ha na-amụta eme.—Ọrụ 13:48.

2018

Foto ndị na-egosi: Isiokwu ‘Ụlọ Nche na ‘Teta!’ ndị e bipụtara n’afọ 2018. 1. ‘Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa?’ 2. ‘Olee Otú Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?’ 3. ‘Ihe Banyere Gị Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?’ 4. ‘Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ.’ 5. ‘Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ.’ 6. ‘Ihe Ga-enyere Ndị Na-eru Uju Aka.’

2019

Foto ndị na-egosi: Isiokwu ‘Ụlọ Nche’ na ‘Teta!’ ndị e bipụtara n’afọ 2019. 1. ‘Ònye Bụ Chineke?’ 2. ‘Ndụ A Ò Nwere Isi?’ 3. ‘Mmadụ Nwụọ, nke Ya Ọ̀ Gaala?’ 4. ‘È Nwere Mgbe Obi Ga-eru Anyị Niile Ala n’Ụwa A?’ 5. ‘Ihe Isii Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta.’ 6. ‘Baịbụl Ọ̀ Ga-emeli Ka Ndụ Gị Ka Mma?’

2020

Foto ndị na-egosi: Isiokwu ‘Ụlọ Nche’ na ‘Teta!’ ndị e bipụtara n’afọ 2020. 1. ‘Ị̀ Chọtala Eziokwu?’ 2. ‘Gịnị Bụ Alaeze Chineke?’ 3. ‘Ihe Chineke Hụrụ Anyị n’Anya Ga-eji Gọzie Anyị.’ 4. ‘Otú Ị ga-esi Belata Nchegbu.’ 5. ‘Azịza Ajụjụ Ise A Na-ajụ Banyere Ahụhụ.’ 6. ‘Ò Nwere Ihe Ga-emeli Ka Ịkpọasị Kwụsị?’

Olee isiokwu na-amasịkarị ndị mmadụ n’ókèala unu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya