MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ
Jiri Ihe Ndị Anyị Ji Eme Nchọnchọ Na-achọ Ihe
Jehova na-enye anyị ngwá ọrụ ndị anyị ga-eji na-akụzi ihe nke ọma. Ụfọdụ n’ime ha bụ, vidio, traktị, magazin, broshọ, akwụkwọ, na ngwá ọrụ anyị bụ́ isi, bụ́ Baịbụl. (2 Tim. 3:16) O nyekwara anyị ihe ndị anyị ga-eji na-eme nchọnchọ ka anyị nwee ike ịna-akọwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ụfọdụ n’ime ha bụ, Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower, JW Library®, Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET™, na Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ.
Ị ga-enwe obi ụtọ ma i jiri ngwá ọrụ ndị a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’Okwu Chineke. Gbalịa kụziere ndị ị na-amụrụ Baịbụl otú ha ga-esi jiri ngwá ọrụ ndị a na-eme nchọnchọ. Hanwa ga-enwekwa obi ụtọ ma ha jiri ha mata azịza ajụjụ ndị ha na-ajụ banyere Baịbụl.
LEENỤ VIDIO BỤ́, NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NABATA AKA JEHOVA NA-ENYERE ANYỊ—IJI IHE NDỊ ANYỊ JI EME NCHỌNCHỌ NA-ACHỌ IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe Joy sịrị na o kwetaghị banyere otú ihe niile si malite?
Olee ebe Linda si chọta ihe kwuru banyere otú ihe niile si malite?
Ịchọta akụ̀ ndị dị n’Okwu Chineke na ịkụziri ya ndị ọzọ na-eme obi ụtọ
Olee otú Linda si họta isiokwu nke ga-akacha abara Joy uru?
Olee uru iji ihe ndị anyị ji eme nchọnchọ chọta ihe baara Linda?