Akụkọ Alaeze Bịara n’Oge Ya nke A Ga-ekesa Gburugburu Mba A
1 Na Sunday, October 1, 1995, onye isi oche ga-ewepụta otu Akụkọ Alaeze dị peji anọ nke na-akpali iche echiche, bụ́ nke a kpọrọ “N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Jupụta Nnọọ ná Nsogbu? Paradaịs nke Nsogbu Na-adịghị na Ya Ọ̀ Pụrụ Ikwe Mee?” ná mmechi nke okwu ihu ọha. A ga-ekesa ozi bịara n’oge ya nke dị n’ime ya gburugburu mba a n’ime oge nke izu atọ ahụ site n’October 1 ruo 22.
2 N’akụkụ nile nke ụwa, ụmụ mmadụ nọ ná mgbagwoju anya. N’agbanyeghị ebe ha bi, nsogbu na-eti ha ihe otiti. Akụkọ Alaeze ahụ ga-abụ ihe mmasị n’ezie nye ndị ji obi eziokwu na-enwe nchegbu banyere ihe na-emenụ, ebe ọ bụ na ọ ga-eduga ha n’Okwu Chineke dị ka isi iyi nke nduzi na-adịghị ada ada maka mmadụ. (Abụ Ọma 119:105) Anyị nile na-atụ anya inweta otu mkpụrụ nke Akụkọ Alaeze ahụ mgbe a ga-ewepụta ya n’October 1, 1995, n’asụsụ ndị a: Bekee, Efịk, Hausa, Igala, Igbo, Isoko, Tiv, na Yoruba. Ka ọ dị ugbu a, e nwere ọtụtụ ihe a ga-eme iji kwadebe maka mkpọsa nke a kpụ ọkụ n’ọnụ ga-adịru izu atọ.
3 Gbaa Mmadụ Nile Ume Ikere Òkè n’Ụzọ Na-ekpo Ọkụ: Ònye pụrụ ikere òkè n’ọrụ ahụ? N’ezie onye ọ bụla bụ onye nkwusa ga-enwe oké mmasị ime otú ahụ! Gịnị banyere ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible bụ́ ndị na-abịachi nzukọ ọgbakọ anya? Ụfọdụ esonyerewo anyị ruo ogologo oge ma nọgide na-enwe ọganihu. Ọ bụrụ na ha emewo ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ, hà ruru eru ịbụ ndị a gụrụ dị ka ndị nkwusa Alaeze? Onye nkwusa na-eduzi ọmụmụ Bible ahụ pụrụ iso onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe kwurịta okwu, ọ bụrụkwa na onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe chọrọ ịdị na-ekere òkè n’ozi ubi, ndị okenye abụọ ga-esoro ya tụleghachi ihe ndị dị na peji nke 98 na 99 nke akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị. E kwesịrị ime nke a ngwa ngwa o kwere mee, ka ndị ruru eru dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism wee nwee ike ikere òkè zuru ezu ná mkpọsa ahụ. A ka pụkwara ịgba ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible ume, bụ́ ndị na-erubeghị eru ka a gụọ ha ná ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, ka ha soro ndị enyi ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha kerịta Akụkọ Alaeze nke a bịara n’oge ya.—Lee Ụlọ Nche, November 15, 1988, peji nke 16, paragraf nke 8.
4 Ọrụ nke a esighị ike; onye ọ bụla pụrụ ikere òkè na ya. Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịgụnye oge mmụgharị ihe ndị e ji Akụkọ Alaeze ahụ na-eme ihe na ha dị ka akụkụ nke ọmụmụ Bible nke ezinụlọ kwa izu ka ndị òtù nile nke ezinụlọ wee nwee ike ịkwadebe nke ọma iche ya n’ihu mmadụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị mfe na-aka nnọọ mma. Mgbe okwu mmeghe dị mkpirikpi gasịrị, nyefee onye nwe ụlọ Akụkọ Alaeze ahụ, ma gbaa ya ume ka ọ gụọ ya. Mgbe ndị nwe ụlọ gosiri mmasị, mee ihe ndekọ ka i wee nwee ike ịlaghachi iji zụlite mmasị ahụ. (1 Kọr. 3:6, 7) Isi ihe dị n’inwe ihe ịga nke ọma bụ inwe okwu dị mfe a kwadebere nke ọma.
5 A ga-enwe ‘ọtụtụ ihe ime’ n’October. N’ihe ntinye nke mbipụta nke a nke Ozi Alaeze Anyị, e nyere ihe ọmụma n’isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Ihe Ime n’Ọrụ Onyenwe Anyị.” A ga-atụle nke a n’izu na-esonụ ná Nzukọ Ije Ozi.—1 Kọr. 15:58, NW.