Nletaghachi Ndị Na-aga nke Ọma Chọrọ Nkụzi Dị Irè
1 Nletaghachi bụ akụkụ dị mkpa ma na-enye ọṅụ nke ozi ubi anyị. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji dị uchu n’ijeghachi na nke ndị nwere mmasị? Ọrụ a nke ime ndị na-eso ụzọ na-eme ka a mara ma na-asọpụrụ aha Jehova, a na-enyekwara ndị na-atụ egwu Chineke aka ịchọta ụzọ nke ndụ. (2 Kọr. 2:17–3:3) Ịmata na ma ido aha Jehova nsọ ma ndụ ndị nke ọzọ bụcha ihe ndị ọ na-agụnye kwesịrị ịkwali anyị ịkwadebe nke ọma tupu anyị ejeghachi.
2 Ezi onye nkụzi ga-enyere nwa akwụkwọ aka iwukwasị ihe ná ntọala e buworo ụzọ tọọ. Dị nnọọ ka onye nkụzi ụlọ akwụkwọ na-ewukwasị ihe n’ihe ọmụma nke ụmụ akwụkwọ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, anyị kwesịrị isochi ọbịbịa mbụ anyị anya site n’ikwu okwu gaa n’ihu n’otu isiokwu ahụ. Nke a na-arụpụta ịtụkwasị ihe ná nghọta na n’iche echiche n’ụzọ na-aga n’ihu.
3 Ná nletaghachi gị mgbe i tinyesịrị broshuọ bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?” ị pụrụ ịhụ na nke a dị irè:
◼ “N’oge gara aga m bịara, anyị kwurịtara banyere ‘mgbe ikpeazụ’ ahụ e kwuru n’ime Bible na ihe nke ahụ pụtara nye anyị. Ọ pụrụ iju gị anya otú anyị siri mara na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ. [2 Tim. 3:1] Ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere oké mmasị inweta azịza nye ajụjụ ahụ. [Gụọ Matiu 24:3.] Ná nzaghachi ya, Jisọs kọwara ọnọdụ ndị anyị na-ahụ gburugburu anyị taa. Ndị a na-agụnye nhụjuanya na ime ihe ike n’ụdị a na-ahụbeghị na mbụ.” Rụtụ aka n’akụkụ ihe ịrịba ama ahụ a tụlere na paragraf nke 3 na 4 na peji nke 19. Ọ bụrụ na e nwere nzaghachi dị mma, rụtụ aka n’akụkụ ndị ọzọ nke ihe ama ahụ na paragraf nke 5 ruo 8 na peji nke 20. Kwuo na ị ga-alaghachi ma zaa ajụjụ ndị e welitere n’ihu broshuọ ahụ.
4 Iji sochie mmasị na broshuọ bụ́ “Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?” ị pụrụ ịsị:
◼ “Ọ gụsiwo m agụụ ike ịmaliteghachi mkparịta ụka anyị banyere nzube anyị n’ịdị ndụ. Echere m na anyị abụọ kwekọrịtara na ọ bụ nzube Chineke ka anyị biri n’elu ụwa a n’ọnọdụ obi ụtọ na nke udo kama ịbụ n’ọgba aghara anyị na-ahụ taa. Ì chere na ọ ga-emezu nkwa ya?” Nye ohere maka nzaghachi. Gụọ Aịsaịa 55:11, ma tụlezie nghọta ndị dị na paragraf nke 25 ruo 27 na peji nke 30. Tụọ aro ọmụmụ Bible onwe onye dị ka ụzọ kasị mma isi chọta nzube bara uru ná ndụ.
5 Iji sochie mmasị e gosiburu na broshuọ bụ́ “Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!” ị pụrụ ịgbasa ya n’ihu ya ọzọ ma sị:
◼ “Anyị kwurịtara banyere ụwa mara mma nke e sere n’azụ broshuọ nke a. Achọrọ m ịgwa gị ihe mere okwukwe na Jisọs Kraịst jiri dị ndị chọrọ ibi n’ebe ahụ oké mkpa.” Sapeta ihe osise nke 41, ma gụọ Aịsaịa 9:6. Kpọtụ uche n’ihe osise nke 62, ma gụọ Jọn 3:16, na-emesi ike mkpa nrubeisi dị. Kọwaa na Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta otú e si egosi okwukwe site n’ịmụ Bible na ịgbalị ịdị ndụ dị ka ndụmọdụ ya si dị.
6 Mgbe nletaghachi nke ọ bụla gasịrị, tụleghachi ya n’ebumnuche nke imeziwanye ịdị irè gị. Jụọ onwe gị, sị: Ọ̀ dị ihe m bu n’uche kpọmkwem ikwu? Emere m ka mmasị dịkwasị na Bible? Èwukwasịrị m ihe na ntọala a tọrọ n’ọbịbịa nke mbụ? À haziri okwu m iduga n’ọmụmụ Bible? Ịza ee n’ajụjụ ndị a na-eme ka e jide n’aka na ị na-agbalị ịbụ ezi onye nkụzi nke Okwu Chineke.