Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọta Abamuru nke Bible
1 Jisọs dokwara ihe dị ndị na-eso ụzọ ya mkpa. Luk 24:45 na-akọ, sị: “O meghere uche ha, ha wee ghọta ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ.” Ọ matara na ọ bụrụ na ha ga-enweta nnwapụta nke Nna ya, ọ dị ha mkpa ịmụ na ịghọta Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 1:1, 2) Ọrụ nkwusa anyị nwekwara otu nzube ahụ. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịmalite ọmụmụ Bible, ebe anyị pụrụ ‘izi ndị mmadụ idebe ihe nile Jisọs nyere n’iwu.’ (Mat. 28:20) N’iburu nke a n’uche, ihe ndị na-esonụ bụ aro ụfọdụ n’ihe ndị pụrụ inye aka mgbe ị na-eme nletaghachi.
2 Ọ bụrụ na ị gụrụ Joshua 1:8 n’ọbịbịa mbụ gị, ị pụrụ ịmaliteghachi nkwurịta okwu gị n’ụzọ dị otu a:
◼ “Alọghachiri m isoro gị kerịta echiche ndị ọzọ n’ihe mere e ji gwa Joshua ka ọ gụọ Bible kwa ụbọchị. A na-ahụta n’ime Bible azịza nye nsogbu ndị kasị dị mgbagwoju anya nke mmadụ nweworo ma ọ bụ ka ga-enwe. Ịdị irè nke ndụmọdụ ya enweghị atụ. Ozi ahụ dị ike ma baa uru. Ma, ì chere na Bible na-esetịpụ ọdịnihu na-adịgide adịgide, nke na-enwupụ enwupụ maka anyị?” Gụọ Aịsaịa 25:8. Sapeta Akụkọ nke 116 ma tụlee paragraf ole na ole na-egosi ihe mere o ji dị mkpa ịnara ezi ihe ọmụma nke Chineke. Mee ndokwa ịlaghachi maka ọmụmụ Bible ebe obibi nke chiri anya.
3 Ọ bụrụ na ị gwara onye gosiri mmasị na Bible okwu, mgbe ahụ ma eleghị anya ụzọ nke a pụrụ ịdị irè n’ịmalite ọmụmụ ihe:
◼ “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile ị gwara okwu ga-agwa gị na ha ga-achọ ụwa nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ha ga-ebi n’ime ya. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe mmadụ nile chọrọ, n’ihi gịnị ka anyị ji nwee ụwa nke jupụtara nnọọ n’ọgba aghara na ime ihe ike?” Nye ohere maka nzaghachi. Kọwaa na ọchịchị ọjọọ nke Setan bụ ihe kpatara ọnọdụ ọjọọ taa. Gụọ Ilu 29:2. Sapeta n’Akụkọ nke 114 ma kọwaa ụzọ Chineke ga-esi jiri Jisọs Kraịst mee ihe ịkwụsị ajọ omume na iguzobe ụwa nke udo na obi ụtọ na-adịgide adịgide. Gụọ Mkpughe 21:3, 4. Mgbe ahụ ị pụrụ ikwu, sị: “N’oge ọzọ m ga-abịa, aga m achọ igosi gị akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ ndị na-akọwa ihe mere ị pụrụ iji lepụ anya n’ihu maka ụwa nke na-enweghị ihe isi ike.”
4 Ọ bụrụ na unu ekwurịtawo ihe mmụta sitere n’ọrụ ebube Jisọs n’ọbịbịa mbụ gị, ị pụrụ ikwu nke a mgbe ị laghachiri:
◼ “Ná mkparịta ụka anyị bu ụzọ, anyị mụtara na ọrụ ebube Jisọs Kraịst jere ozi dị ka ngosi nke ihe ọ ga-arụzu n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ya. Ịmụ Akwụkwọ Nsọ dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-erite uru site n’ọchịchị ya. Mgbalị si n’ezi obi imekwu nke a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe Chineke kwadebeere anyị. [Gụọ Jọn 17:3.] Anyị ewulitewo usoro ọmụmụ Bible nke nyewooro ọtụtụ puku aka ịmụtakwu banyere ihe Chineke kwere ná nkwa na ụzọ anyị pụrụ isi mee ya obi ụtọ.” Gbasapụ akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi ahụ n’ihu ya, tụleghachi aha isiakwụkwọ ya, ma gosi ụzọ anyị si eduzi ọmụmụ Bible.
5 Ọ bụrụ na ị pụrụ inyere ndị nwere ezi obi aka ịghọta abamuru kasị mma nke Okwu Chineke, i nyeworo ha aka n’ụzọ kasị mma kwere omume. Amamihe nke ha pụrụ inweta site n’ịmụ ya pụrụ ịbụ “osisi na-enye ndụ,” nke ga-ewetara ha ọtụtụ obi ụtọ.—Ilu 3:18.