Ndị Ruru Eru na Ndị A Kwadebere Izi Ndị Ọzọ Ihe
1 Mgbe a họpụtara Mosis ịbụ onye nnọchiteanya Jehova, ọ dịghị ya ka o ruru eru ịkpọsara Fero okwu Chineke. (Ọpụ. 4:10; 6:12) Jeremaịa gosipụtara enweghị obi ike ya n’inwe ike ije ozi dị ka onye amụma Jehova, na-agwa Chineke na ya amaghị ikwu okwu. (Jer. 1:6) N’agbanyeghị enweghị obi ike ha ná mmalite, ndị amụma abụọ ahụ ghọrọ ndị àmà na-adịghị atụ egwu nye Jehova. Chineke mere ka ha ruo eru nke ọma.
2 Taa, site n’enyemaka Jehova, anyị nwere ihe dị anyị mkpa iji jezuo ozi anyị n’obi ike. (2 Kọr. 3:4, 5; 2 Tim. 3:17) Dị ka onye na-edozi ígwè ọrụ nke ruru eru nke nwezuru ngwá ọrụ, a kwadebere anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji nkà jezuo ozi e kenyere anyị. Na January anyị na-eme nnyefe pụrụ iche nke akwụkwọ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, na Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’ọnụ ego dị ala. Ndị a bụ ngwá ọrụ ime mmụọ ga-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu ahụ. A pụrụ ịgbanwe ụzọ iche okwu n’ihu mmadụ ndị na-esonụ a tụrụ aro ha ikwekọ n’akwụkwọ nke ọ bụla a na-enyefe.
3 A pụrụ iji okwu agụmakwụkwọ kpalie mmasị n’Okwu Chineke. Ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka site n’ikwu, sị:
◼ “A na-ekwu ọtụtụ okwu taa banyere mkpa nke ezigbo agụmakwụkwọ. N’echiche gị, ụdị agụmakwụkwọ dị aṅaa ka mmadụ kwesịrị ịchụso iji jide obi ụtọ na ihe ịga nke ọma kasịnụ ná ndụ n’aka? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ndị na-anara ihe ọmụma Chineke pụrụ inweta uru ebighị ebi. [Gụọ Ilu 9:10, 11.] Akwụkwọ a, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, dabeere na Bible. Ọ na-ezo aka na nanị otu isi iyi nke ihe ọmụma nke pụrụ iduje ná ndụ ebighị ebi.” Gụpụta peji nke 16, paragraf nke 24. Ọ bụrụ na e gosiri ezi mmasị, nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego ₦50, meekwa ndokwa maka nletaghachi.
4 Mgbe ị na-alaghachikwuru onye nwe ụlọ nke gị na ya kwurịtara ịdị mkpa nke agụmakwụkwọ Bible, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ná nleta ikpeazụ m, anyị kwurịtara banyere Bible dị ka isi iyi nke agụmakwụkwọ nke pụrụ ime ka anyị jide ọdịnihu ebighị ebi anyị n’aka. N’ezie, ọ na-achọ mgbalị iji mụta ihe ọ dị anyị mkpa ịma site n’Akwụkwọ Nsọ. [Gụọ Ilu 2:1-5.] Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịghọta akụkụ Bible ụfọdụ. Ọ ga-amasị m igosi gị ná mkpirikpi otu ụzọ anyị jiworo mee ihe nke ukwuu iji nyere ndị mmadụ aka ịmụtakwu banyere ozizi Bible ndị bụ isi.” N’iji akwụkwọ ahụ e nyefere eme ihe, sapeta isi nke 8, “Ụdị Ndi-Eyì Di Aṅa Ka I Nachọ?,” gosikwa ná mkpirikpi ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ inwe ọmụmụ ihe chiri anya, kọwaa na ị ga-eji ihe na-enyere anyị aka ịmụ ihe bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi laghachite.
5 Nhụjuanya nke ọtụtụ nde ụmụaka nọ n’ụwa na-enye ọtụtụ ndị nsogbu. Ikekwe ị pụrụ inyere onye nwe ụlọ aka ịhụ otú Chineke si ele ọnọdụ ọjọọ a anya site n’ikwu, sị:
◼ “Obi abụọ adịghị ya na ị hụwo akụkọ banyere ụmụaka nọ gburugburu ụwa ndị agụụ na-agụ, ndị na-arịa ọrịa, na ndị e leghaara anya. N’ihi gịnị ka òtù ndị o metụtara na-enwebeghị ike imeziwanye ọnọdụ ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Chineke chọrọ nanị ihe kasị mma maka ụmụ mmadụ. Rịba ama ihe ọ na-ekwe ụmụaka na ndị okenye ná nkwa, dị ka e dekọrọ n’ime Bible. [Gụọ Mkpughe 21:4.] Akwụkwọ a [kpọọ aha nke ọ bụla n’akwụkwọ ndị a gụnyere ná nnyefe ahụ pụrụ iche] na-enyekwu nkọwa banyere ụwa nke Chineke ga-eme ebe nhụjuanya na-agaghị adịkwa.” Sapeta ihe osise ndị dị na peji nke 4 na 9 n’akwụkwọ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? ndị na-egosi Paradaịs ma kwurịta ya. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego dị ala, meekwa ndokwa maka nleta ọzọ.
6 Ọ bụrụ na i kwuru okwu na mbụ banyere nhụjuanya nke ụmụaka, ná nleta ọzọ ị pụrụ ịga n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ site n’ikwu, sị:
◼ “Mgbe m bịara ebe a na nso nso a, i kwupụtara nchegbu gị banyere ọnọdụ ọjọọ nke ụmụaka ndị na-ahụju anya n’ihi ebe obibi ndị dakpọrọ adakpọ, ụnwụ nri, ọrịa, na ime ihe ike. Ọ bụ ihe na-akasi obi ịgụ n’ime Bible banyere ụwa ebe ma ụmụaka ma ndị okenye na-agaghị arịa ọrịa, nwee ahụ mgbu, ma ọ bụ nwụọ. Otu amụma dị n’akwụkwọ Aịsaịa na-akọwa ndụ ka mma nke ga-abịa n’ụwa.” Gụọ ma kwurịta Aịsaịa 65:20-25. Werezie ya gaa n’ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.
7 Ebe ọ bụ na ndị ji okpukpe kpọrọ ihe na-ekpekarị ekpere, ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka n’isiokwu a site n’ikwu, sị:
◼ “N’otu oge ná ndụ anyị, ihe ka ukwuu n’ime anyị enwewo nsogbu ndị kpaliworo anyị ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka. Ma, ọtụtụ na-eche na a dịghị aza ekpere ha. Ọ na-eyi ọbụna ka a dịghị anụ olu ndị ndú okpukpe ndị na-ekpe ekpere maka udo n’ihu ọha. Anyị na-ekwu nke ahụ n’ihi na agha na ime ihe ike nọgidere na-enye ndị mmadụ nsogbu. Chineke ọ̀ na-ege ntị n’ekpere n’ezie? Ọ bụrụ na ọ na-ege, gịnị mere ọtụtụ ekpere ji yie ka a dịghị aza ha? [Nye ohere maka nzaghachi.] Abụ Ọma 145:18 na-akọwa ihe a chọrọ ma ọ bụrụ na a ga-aza ekpere anyị. [Gụọ akwụkwọ nsọ.] Otu ihe bụ na ekpere ndị a na-ekpegara Chineke aghaghị isi n’ezi obi ma kwekọọ n’eziokwu a na-achọta n’Okwu ya, bụ́ Bible.” Gosi akwụkwọ ị na-enyefe, kọwapụtakwa ihe ọ na-ekwu banyere uru nke ekpere. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego dị ala.
8 Mgbe ị na-esochi mkparịta ụka mbụ e nwere banyere ekpere, ị pụru ịnwale ụzọ a:
◼ “Mkparịta ụka anyị nwere banyere ekpere tọrọ m ụtọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọpụta echiche Jisọs banyere ihe ndị a ga-ekpe ekpere maka ha dị ka nduzi na-enye aka.” Gụọ Matiu 6:9, 10, na-akọwapụta nchegbu ndị bụ isi Jisọs gosipụtara n’ekpere nlereanya ya. Gosi isi nke 16, “Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso,” n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, jụọkwa ma ị pụrụ igosi ụzọ isi mụọ akwụkwọ ahụ.
9 Mgbe a bịara n’inyefe ndị ọzọ ihe ọmụma Chineke, anyị pụrụ ịjụ, sị, “Ònye ruru ime ihe ndị a?” Akwụkwọ Nsọ na-aza, sị: “Anyị ruru.” (NW)—2 Kọr. 2:16, 17.